Jeremaya 50:16 - Bible Nso16 Bipunu ọgha-nkpuru nime Babilon, ya na onye nēji mma-iwe-ihe-ubi na mb͕e owuwe-ihe-ubi: n'iru mma-agha nēme ihe-ike ha gēche iru, onye ọ bula n'ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula n'ala-ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi. Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya, ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya, nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu. Faic an caibideil |