Jeremaya 50:15 - Bible Nso15 Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a15 Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile! Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala, a kwatuokwala mgbidi ya niile. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn, bọọnụ ya ọbọ. Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ. Faic an caibideil |
Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis.
Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebe-ita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka ha si n'aru ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum?
Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Mb͕idi nile nke Babilon nke sara mbara, agēme ka ha ghọ ebe dasiri adasi, ọzọ, ọnu-uzọ-ama-ya nile nke di elu, agēji ọku sure ha; ndi nile di iche iche gādọb͕u kwa onwe-ha n'ọlu n'efu, mba di iche iche gādọb͕u onwe-ha n'ọlu itiye n'ọku: ike ewe gwu ha.