Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 50:14 - Bible Nso

14 Donu onwe-unu n'usoro imegide Babilon buruburu, unu ndi nile ndi nāzọ uta ukwu ikwe ya; b͕anu ya, unu asọlara àkú anya: n'ihi na Jehova ka o mehieworo megide.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn, unu ndị niile na-agba ụta. Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụ nʼihi na o mehiela megide Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 50:14
21 Iomraidhean Croise  

Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n'etiti ndi nile arọputara arọputa n'Israel, do ha n'usoro izute Siria:


Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo, Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo: Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu, Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe.


Nuru olu ìgwè n'ugwu nile, yiri nke ndi bara uba! nuru olu nkpotu ala-eze nile nke mba nile achikọtaworo! Jehova nke usu nile nke ndi-agha nāgukọta usu-ndi-agha ibu agha.


ndi àkú-ha nile di nkọ, uta-ha nile ka azọrọ ukwu ikwe ha; aguwo ukwu inyinya-ha nile dika ọmu, na wheel-ha nile dika oké ifufe:


Rigonu, unu inyinya; kpọtuanu nkpọtu, unu ub͕ọ-ala; ka ndi-dike puta kwa: Kush na Put, ndi nēji ọta; na Ludim, ndi nēji nāzọ kwa uta ukwu ikwe ya.


Akukọ ka m'nuworo sitere na Jehova, ọ bu kwa ukọ̀ ka ezigaworo n'etiti mba nile, si, Chikọtanu onwe-unu, bia imegide ya, bili-kwa-nu ibu agha.


Otú a ka Jehova nke usu nile ndi-agha siri: Le, M'gaje ib͕aji uta Ilam, bú isi ihe nke idi-ike-ha.


N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;


Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n'ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ha bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕ọ dika oké osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Babilon.


Ndi nile ndi nāchọputa ha eripiawo ha: ndi nākpab͕u ha siri, Ikpe amaghi ayi, n'ihi na ha emehiewo megide Jehova, bú ebe-obibi nke ezi omume, na olile-anya nke ndi bu nna-ha, bú Jehova.


N'ihi na, le, Mu onwem gaje ikpọte me ka nkpọkọta mba uku di iche iche si n'ala Ugwu rigoputa imegide Babilon: ha gēdo kwa onwe-ha n'usoro megide ya; agēsi n'ebe ahu were ya: àkú nke usu ahu gādi ka nke dike nke bu ọ̀kà-uta; ọ gaghi-alaghachi azu n'efu.


M'gēziga-kwa-ra Babilon ndi ala ọzọ, ndi gāfucha ya; ha gāwusi kwa ala-ya dika miri; n'ihi na ha nọ nēmegide ya buruburu n'ubọchi ihe ọjọ.


Bulienu ọkọlọtọ n'ala ahu, fùanu opì-ike n'etiti mba nile, donu mba di iche iche nsọ imegide ya, menu ka ala-eze, bú Ararat, na Mini, na Ashkenaz, nuru, zukọ imegide ya: menu ka otù ọchi-agha buru onye-nlekọta imegide ya; menu ka inyinya rigota dika igurube di egwu.


Ka okwe-uta kwe uta-ya n'ebe onye nēkwe uta nọ, na n'ebe onye nēweli onwe-ya elu n'uwe-agha-ya nọ: unu enwe-kwa-la ọmiko n'aru umu-okorọbia-ya; wezuganu usu-ndi-agha-ya nile ka ebibie ya.


N'ihi na ihe-ike emere Lebanon gēkpuchi gi, na nbibi nke anumanu di iche iche, nke mere ka ha tua ujọ; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya.


N'ihi na i kwatawo ọtutu mba, ya ka ndi nile fọduru nime ndi nile di iche iche gākwata gi; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya.


edekwasi-kwa-rari aha n'egedege-iru-ya, bú IHE-OMIMI, BABILON UKU AHU, NNE NKE NDI NÁKWA IKO NA NKE IHE-ÁRÚ NILE NKE UWA.


Devid we bilie n'isi-ututu, rapu ìgwè ewu na aturu ahu n'aka onye nēdebe aturu, o we būru, je, dika Jesi nyere ya iwu: o we biarue ebe anēdebe ub͕ọ-ala, mb͕e usu-ndi-agha ndi nāpukuru usoro-agha nēti nkpu n'agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan