N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Biko, juanu n'etiti mba nile, si, Ònye nuworo ihe di ka ndia? ihe jọb͕uru onwe-ya nke-uku ka nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke meworo.
Ọzọ, n'aru ndi-amuma Jerusalem ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya; ha nākwa iko, nējeghari kwa n'okwu-ugha, ha emewo kwa ka aka ndi nēme ihe ọjọ di ike, ha we ghara isi, onye ọ bula n'ihe ọjọ ya, lata: ha nile aghọworom ihe di ka Sọdọm, ndi bi nime ya aghọwo-kwa-ram ihe di ka Gọmọra.