Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 5:28 - Bible Nso

28 Ha amawo abuba, aru-ha eb͕uwo àmùmà: e, emebigawo ihe ọjọ ókè: ha ekpeghi ọnu, bú ọnu nke nwa-nb͕ei, ka o we gara ha nke-ọma; ọ bu kwa ikpe nke ndi-ob͕eye ka ha nādighi-ekpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ. Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ; ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi. Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna; ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 5:28
24 Iomraidhean Croise  

Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n'udo, Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe; Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n'aka-ya.


Obi-ha bu nání abuba dika abuba; Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku.


Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe, Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa, Zọpia kwa onye-nmeb͕u.


Le, ndia bu ndi nēmebi iwu; Ọzọ, ebe ha nānọgide n'udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù.


N'ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n'ọnwu-ha: Ma aru-ha mara abuba.


Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu: Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


Onye ezi omume ka I bu, Jehova, mb͕e mu na Gi nēkperita ikpe: ma otú ọ di, okwu ikpem nile ka m'gēkwu n'ebe I nọ: gini mere uzọ ndi nēmebi iwu ji agara ha nke-ọma? gini mere ndi nile nāghọb͕u nke-uku ji anọ n'udo?


Gini mere i ji eme ka uzọ-gi di nma ichọ ihu-n'anya? n'ihi ya ọbuná ndinyom ọjọ ka i zíworo uzọ-gi nile.


Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a.


ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ:


Nurunu okwu a, unu nne-ehi nke Beshan, ndi nọ n'ugwu Sameria, ndi nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, ndi nāzọpia umu-ob͕eye, ndi nāsi ndi-nwe-ha, Wetanu, ka ayi ṅua.


unu emeb͕u-kwa-la nwanyi di-ya nwuru, na nwa-nb͕ei, na ọbìa, na onye ewedara n'ala; unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide nwa-nne-ya.


Anānu nọ̄ na ikwa-iko di n'etiti unu, aha ikwa-iko nke nādighi kwa ọbuná n'etiti ndi mba ọzọ, nke mere na otú onye n'etiti unu nwere nwunye nna-ya.


Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan