Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 5:2 - Bible Nso

2 Ma ọ buru na ha asi, Jehova nādi ndu; n'ezie n'okwu-ugha ka ha na-aṅu iyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ bụ ezie, na ha na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ ma ha ka na-aṅụ iyi nʼokwu ụgha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 5:2
15 Iomraidhean Croise  

Nurunu nka, unu ulo Jekob, ndi anākpọ n'aha Israel, ndi siwo-kwa-ra na miri Juda puta; ndi ji aha Jehova aṅu iyi, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha nēhota, ma ọ bughi n'ezi-okwu, ọ bughi kwa n'ezi omume.


i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.


N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi bi n'ala Ijipt: Le, Mu onwem ewerewo aham di uku ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na aham agaghi-abu kwa ọzọ ihe anākpọ n'ọnu onye ọ bula nke Juda n'ala Ijipt nile, si, Onye-nwe-ayi Jehova nādi ndu.


Ùnu ganēzu ori, nēb͕u madu, nākwa iko, nāṅu iyi ugha, nēsurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nējeso chi ọzọ di iche iche nke unu nāmaghi,


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na m'nwere ebe inọ ọnọdu-abali nke ndi-ije n'ọzara; ka m'we rapu ndim, si n'ebe ha nọ la! n'ihi na ha nile bu ndi nākwa iko, nzukọ ndi-nghọb͕u.


Ha ekwuwo okwu efu di iche iche, ha nāb͕a iyi ugha, ha nāb͕a ndu: ikpe ewe pulite dika hemlok nime ọ̀b͕à ubi.


Ọ bu ezie na onye nākwa iko ka i bu, Israel, ma ka ikpe ghara ima Juda; unu abia-kwa-la na Gilgal, unu arigo-kwa-la na Bet-even, unu aṅu-kwa-la iyi, si, Jehova nādi ndu.


Unu ewe-kwa-la aham ṅu iyi n'okwu-ugha, we me ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.


na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n'elu-igwe n'elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi;


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, nye ndi nēzu madu n'ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu;


ndi nēnwe udi nke nsọpuru-Chineke, ma ha agọwo ike-ya: gi b͕akuta kwa ndia azu.


Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan