Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 49:8 - Bible Nso

8 B͕alaganu, chigharia, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Dedan; n'ihi na nhuju-anya Isọ ka M'gēme ka ọ biakwasi ya, mb͕e M'gēleta ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan. Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi, nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ, nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 49:8
22 Iomraidhean Croise  

ka o we ba n'oghere nile nke oké nkume nile, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku.


Ibu ebero Arebia. N'oké ọhia di n'Arebia ka unu gānọ ọnọdu-abali, unu usu-ije nile nke ndi Dedan.


N'ihi na mma-agham aṅujuwo afọ n'elu-igwe: le, Edom ka ọ gāridakwasi, ridakwasi kwa ndi M'wezugara ka ebibie ha, ikpe ikpe.


Dedan, na Tima, na Buz, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha;


Ọzọ, ndi-ya egoro agha ndi nọ n'etiti ya di ka umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba; n'ihi na ha onwe-ha elewo anya n'azu, ha ab͕alagawo n'otù, ha eguzogh: n'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha abiakwasiwo ha, bú mb͕e nleta-ha.


Rapunu obodo nile, we biri na nkume di elu, unu ndi bi na Moab; di-kwa-nu ka nduru nke nālu akwu-ya n'ofè ọnu olùlù.


Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


B͕alaganu, wepuganu onwe-unu, di-kwa-nu ka osisi tamarisk n'ọzara.


B͕alaganu, wagharia nke-uku, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Hezoa, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, aduwo ọdu megide unu, ọ chèwo kwa èchìchè megide unu.


Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n'agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M'gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n'ofè-ya nile ka M'gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n'ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.


Laghachinu n'ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n'etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n'elu Bet-hakarem: n'ihi na ihe ọjọ si n'Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M'gēseti kwa akam n'aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha.


ma Isọ ka M'kpọworo asì, me ugwu-ya nile ka ha ghọ ebe tọḅọrọ n'efu, M'were ihe-nketa-ya nye nkita-ọhia nile nke ọzara.


Ọ bu ezie na Edom nāsi, Etituwo ayi, ma ayi gēwughachi nkpọnkpọ ebe nile; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ndi ahu gēwu, ma Mu onwem gākwatu: agākpọ kwa ha Ókè-ala nmebi-iwu, na Ndi ahu nke Jehova wesaworo oké iwe rue mḅe ebighi-ebi.


Ndi-eze nke uwa, na ndi-amadi, na ndi-isi-ọchi-agha, na ndi-ọgaranya, na ndi di ike, na orù ọ bula, na onye ọ bula nwere onwe-ya, we zobe onwe-ha nime ọb͕à na nime oké nkume nke ugwu:


Aka Midian we di ike n'aru Israel: n'ihi Midian ka umu Israel mere onwe-ha ebe miri nērù nke di n'ugwu, na ọb͕à, na ebe ewusiri ike.


Ndikom Israel we hu na nkpà nākpà ha, (n'ihi na anāchi Israel n'ihe-ike), ndi Israel we zo onwe-ha n'ọb͕à, na n'ọhia-ogwu, na nime nkume di elu, na n'ulo-elu, na n'olùlù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan