Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 49:7 - Bible Nso

7 Nke diri Edom. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Amam-ihe, ọ̀ dighi kwa na Timan ọzọ? ndum-ọdu, ọ̀ lanariwo ndi-nghọta n'iyì? amam-ihe-ha, àwusiwo ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Nke dịrị Edọm: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman? Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta? Amamihe ha o reela ure?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 49:7
39 Iomraidhean Croise  

Isọ we si Jekob, Biko, kwe ka m'loda ufọdu nime ihe a nācha ọbara ọbara; n'ihi na ada-wom #mbà; n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Edom.


Isọ we kpọ Jekob asì n'ihi ngọzi ahu nke nna-ya gọziri ya: Isọ we si n'obi-ya, Ubọchi iru-újú bayere nnam nābiaru nso; m'gēb͕u kwa Jekob nwa-nnem.


Jekob we zie ndi-ozi n'iru ya jekuru Isọ nwa-nne-ya rue ala Sia, bú ọhia Edom.


Umu-ndikom Elifaz bu Timan, na Oma, na Zefo, na Gatam, na Kenaz.


Ndia bu ndi-isi nke umu Isọ: umu-ndikom Elifaz ọkpara Isọ; Timan onye-isi, Oma onye-isi, Zefo onye-isi, Kenaz onye-isi.


Jobab we nwua, Husham, nke sitere n'ala ndi Timan, we buru eze n'ọnọdu ya.


Isọ we biri n'ugwu Sia: Isọ bu Edom.


Kenaz onye-isi, Timan onye-isi, Mibza onye-isi;


Ndi-eyì atọ nke Job we nu ihe ọjọ a nile nke biakwasiri ya, ha we bia, nwoke ọ bula site n'ebe-ya; Elifaz, bú onye Timan; na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama: ha we zukọta n'otù ibia igosi ya ebere ha ji n'aru ya na ikasi ya obi.


Elifaz, bú onye Timan, we za, si,


Jehova, cheta ubọchi Jerusalem Megide umu Edom; Ndi nāsi, B͕abanu ya ọtọ, b͕abanu ya ọtọ, Rue ntọ-ala di nime ya.


Ibu eboro Duma. Mu ka otù onye nākpọ òkù site na Sia, si, Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali? Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali?


n'ihi nka, le, M'gaje ilu kwa oké ọlu ọzọ n'etiti ndi nka, bú oké ọlu na ọlu ebube: amam-ihe nke ndi-ha mara ihe gāla kwa n'iyì, nghọta nke ndi-nghọta-ha gēzobe kwa onwe-ya.


Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M'meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M'gaje iropu ha n'elu ala-ha, ulo Juda ka M'gēropu kwa n'etiti ha.


Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n'ihi na iwu agaghi-esi n'ebe onye-nchu-àjà nọ la n'iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n'ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n'ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n'okwu-ya nile.


na Edom, na Moab, na umu Amon;


Dedan, na Tima, na Buz, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha;


le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.


N'ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Edom; na èchìchè-Ya nile, nke O chèworo megide ndi bi na Timan, si: N'ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu; n'ezie o gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha.


Ihere emewo ndi mara ihe, ha atuwo ujọ, ewe jide ha: le, okwu Jehova ka ha juworo; ọ̀ bu kwa aha amam-ihe gini ka ha nwere?


Ka obi nātọ gi utọ, ṅuria ọṅu, gi ada Edom, nke bi n'ala Uz: Ọbuná gi ka iko gāgabigaru: i gāṅubiga manya ókè, b͕aba onwe-gi ọtọ.


N'ebe ahu ka Edom na ndi-eze-ya na ndi-isi-ya nile nọ, ndi atọb͕ọworo n'idi-ike-ha n'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u: ndi ahu gēsoro ndi anēbighi úgwù, so kwa ndi nārida n'olùlù, dina.


Ọ gābà kwa n'ala ahu mara nma, ọ di kwa ọtutu ala gāsu ngọngọ: ma ndia ka agēme ka ha wepuga onwe-ha n'aka-ya: Edom, na Moab, na ndi-isi n'umu Amon.


Ijipt gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, Edom gāghọ kwa ọzara, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi ihe-ike emere umu Juda, n'ihi na ha awusiwo ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ala-ha.


Chineke si na Timan nābia, Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. Selah Ebube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile, Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.


Akpọla onye Edom ihe árú; n'ihi na nwa-nne-gi ka ọ bu: akpọla onye Ijipt ihe-árú; n'ihi na ọbìa ka i buri n'ala-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan