Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 49:39 - Bible Nso

39 Ma o gēru, n'ikpe-azu nke ubọchi nile, na M'gēme ka ndi Ilam adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

39 “Ma nʼikpeazụ, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, aga m eweghachite akụnụba niile nke Elam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 49:39
15 Iomraidhean Croise  

Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n'agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n'ihe nile Job nwere okpùkpù abua.


O gēru kwa n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ya elu kari ugwu ntà nile; mba nile gērùbà nime ya dika osimiri.


O gēru kwa, mb͕e M'ropusiri ha, na M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha ọzọ; M'gēme kwa ka ha lata, onye ọ bula n'ihe-nketa-ya, na onye ọ bula n'ala-ya.


Ma M'gēme ka ndi Moab adọtara n'agha laghachi n'ikpe-azu nke ubọchi nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Rue ebe a bu ikpé Moab.


M'gēdo kwa oche-eze nkem n'Ilam, M'gēme kwa ka eze na ndi-isi si n'ebe ahu la n'iyì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma emesia M'gēme ka umu Amon adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n'agha laghachi, M'gēme kwa ka ha laghachi n'ala Patros, n'ala nputa-n'uwa-ha; ha ewe nọ n'ebe ahu, buru ala-eze di ala.


i gārigo kwa imegide ndim, bú Israel, dika igwe-oji ikpuchi ala; n'ikpe-azu nke ubọchi ndia ka ọ gēru, na M'gēme ka i biakwasi alam, ka mba nile we maram, mb͕e agēdowomri nsọ nime gi n'anya-ha, gi Gog.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ub͕u a ka M'gēme ka ndi Jekob adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel nile; M'gēkwo-kwa-ra aha nsọm ekworo.


Ma abiawom ime ka i ghọta ihe ahu nke gādakwasi ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia: n'ihi na ọhù fọduru nke diri ubọchi ndia.


ma Chineke di, Onye nọ n'elu-igwe, Nke nēkpughe ihe-nzuzo nile, O mewo kwa ka eze, bú Nebukadneza, mara ihe aghaghi idi n'ikpe-azu ubọchi ndia. Nrọ-gi, na ọhù nile nke isi-gi n'elu ihe-ndina-gi, nka ka ọ bu:


emesia umu Israel gālata, chọ Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha; ha gēji kwa oké egwu biakute Jehova, biaru kwa idi-nma-Ya na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.


M'gēme kwa ka ndim adọtara n'agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọb͕ọrọ n'efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ṅua manya-ha; ha gēme kwa ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha.


Ọ gēru kwa, n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ugwu ahu elu kari ugwu ntà nile; ndi di iche iche gērùbà nime ya dika osimiri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan