Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 49:17 - Bible Nso

17 Edom gāghọ kwa ihe-iju-anya: o gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 “Edọm ga-aghọ ihe iju anya. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 49:17
16 Iomraidhean Croise  

ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāma ọsọ; ha gāsi kwa, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a?


ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya.


N'ihi na Onwem ka M'jiri ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ihe-iju-anya na ihe-ita-uta na nkpọnkpọ ebe na ihe-nkọcha ka Bọzra gāghọ; obodo-ya nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe mb͕e ebighi-ebi.


Site n'iwe Jehova madu agaghi-ebi nime ya, ma ọ gābusi ebe tọb͕ọrọ n'efu; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku Babilon anya, ọ gāma ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.


Babilon gāghọ kwa nání obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nkita-ọhia, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, ghara inwe onye-obibi.


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M'gēseti kwa akam n'aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha.


Ndi-ahia n'etiti ndi nile di iche iche amawo gi ọsọ; oké egwu ka i ghọworo, i gaghi-adi kwa ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Dika i ṅuriri ọṅu n'isi ihe-nketa nke ulo Israel, n'ihi na ọ tọb͕ọrọ n'efu, otú a ka M'gēme gi: ebe tọb͕ọrọ n'efu ka i gābu, gi ugwu Sia, na Edom nile, ọbuná Edom nile: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, ugwu Sia, M'gēseti kwa akam imegide gi, M'gēme kwa ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya.


M'gēme kwa ugwu Sia ka ọ ghọ ihe-iju-anya na ebe tọb͕ọrọ n'efu; M'gēbipu kwa nime ya onye nāgabiga na onye nālaghachi.


N'ihi na anēdebe ukpuru nile nke Ọmri, na ọlu nile nke ulo Ehab, unu ewe jeghari nime ndum-ọdu nile ha: ka M'we me gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, me kwa ndi bi nime-ya ka ha ghọ ihe-ima-ọsọ; ọ bu kwa ita-uta ndim ka unu gēbu.


Nka bu obodo ahu nke nāṅuri ọṅu-agha, nke nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n'obi-ya, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem: le otú ọ ghọworo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-nmakpu diri anu-ọhia! onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya gāma ọsọ, fegharia aka-ya.


Ọb͕ọ ahu nke di n'iru, bú umu-unu ndi gēbili inọchi unu, na onye ala ọzọ nke gēsi n'ala di anya bia, gāsi, mb͕e ha nāhu ihe-otiti nile nke ala ahu, na ọria nile ya, nke Jehova jiworo me ka ọ nāria ọria;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan