Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 49:13 - Bible Nso

13 N'ihi na Onwem ka M'jiri ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ihe-iju-anya na ihe-ita-uta na nkpọnkpọ ebe na ihe-nkọcha ka Bọzra gāghọ; obodo-ya nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 49:13
21 Iomraidhean Croise  

si, Ejim Onwem ṅu iyi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na n'ihi na i mewo ihe a, n'ihi na i b͕ochighi kwa nwa-gi nwoke, onye i nwere nání ya:


Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bozra, we buru eze n'ọnọdu ya.


Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bọzra, we buru eze n'ọnọdu ya.


Mma-agha Jehova juputara n'ọbara, emewo ka ọ ma abuba site n'abuba, site n'ọbara umu-aturu na nkpi, site n'abuba nke akuru ebulu: n'ihi na àjà di Jehova nwere na Bọzra, O nwe-kwa-ra oké ob͕ub͕u n'ala Edom.


Ejiwom Onwem ṅua iyi, otù okwu esiwo n'ọnum puta n'ezi omume, ọ gaghi-alaghachi kwa, si, na Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru, Mu ka ire nile ọ bula gāṅuru iyi.


Ònye bu nka nēsi n'Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n'uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n'iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, di ike izọputa.


ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya.


M'gēme kwa ka obodo a ghọ ihe-iju-anya, ka ọ ghọ kwa ihe-ima-ọsọ; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.


N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi bi n'ala Ijipt: Le, Mu onwem ewerewo aham di uku ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na aham agaghi-abu kwa ọzọ ihe anākpọ n'ọnu onye ọ bula nke Juda n'ala Ijipt nile, si, Onye-nwe-ayi Jehova nādi ndu.


biakwasi kwa Keriot, biakwasi kwa Bọzra, biakwasi kwa obodo nile nke ala Moab, nke di anya ma-ọbu nke di nso.


Le, dika ugo ka ọ gārigo, fesie ike, b͕asa nkù-ya n'elu Bọzra: obi ndi-dike Edom n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha ejiwo Onwe-ya ṅu iyi, si, N'ezie M'gēmeju gi na madu, dika igurube; ha gēti kwa nkpu megide gi, bú nkpu nke nzọcha-nkpuru-vine.


Ijipt gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, Edom gāghọ kwa ọzara, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi ihe-ike emere umu Juda, n'ihi na ha awusiwo ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ala-ha.


ma M'gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra.


Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo Onwe-ya ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta), si: Mu onwem nākpọ npako Jekob ihe-árú, ọ bu kwa ulo-elu-ya nile ka M'kpọworo asì: M'gēmechibido kwa obodo na ùjú-ya nye n'aka onye-iro.


Ulo Jekob gābu kwa ọku, ulo Josef gāghọ kwa ire-ọku, ma ulo Isọ gāghọ ahihia-ọka, ha gēre kwa ọku n'etiti ha, ripia ha: ọ dighi kwa onye fọduru afọdu ulo Isọ gēnwe; n'ihi na Jehova ekwuwo okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan