Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 49:11 - Bible Nso

11 Rapu umu-nb͕ei-gi, Mu onwem gēdebe ha ndu; ka ndinyom-i di-ha nwuru tukwasim obi-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 ‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ. Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 49:11
12 Iomraidhean Croise  

Jehova nēdebe ndi ala ọzọ; Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ; Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ.


Nna nke umu-nb͕ei, na onye-ikpe nke ndinyom di-ha nwuru, Ka Chineke bu n'ebe-obibi-Ya di nsọ.


Kpenu onye nēnweghi ike na nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi: Guanu onye ewedara n'ala na onye nọ na nkpà n'onye ezi omume.


Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere.


Mu onwem kwa, M'gaghi-emere Nineve ebere, bú obodo uku ahu; nke ihe kari orú nnù madu uzọ iri-na-ise nọ nime ya, bú ndi nāmaghi nke bu aka-nri-ha na aka-ekpe-ha; na ọtutu anumanu?


unu emeb͕u-kwa-la nwanyi di-ya nwuru, na nwa-nb͕ei, na ọbìa, na onye ewedara n'ala; unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide nwa-nne-ya.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ọ nēme ihe ekpere n'ikpe bayere nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru, Ọ nāhu kwa ọbìa n'anya, inye ya nri na uwe-nb͕okwasi.


Ma nwanyi nke bu onye di-ya nwuru n'ezie, nke arapu-kwa-ra nání ya, ọ tukwasiwo obi-ya na Chineke, nānọgide kwa n'aririọ-ya na ekpere-ya abali na ehihie.


Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan