Jeremaya 48:47 - Bible Nso47 Ma M'gēme ka ndi Moab adọtara n'agha laghachi n'ikpe-azu nke ubọchi nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Rue ebe a bu ikpé Moab. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a47 “Ma emesịa, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, aga m eme ka ndị Moab a dọtara nʼagha lọghachi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Nke a bụ ọgwụgwụ ikpe ọmụma dịrị Moab. Faic an caibideil |
Na mb͕e ahu ka agēdukuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha ùtú, nke bu otù ndi di ogologo di kwa lari n'aru, nke site-kwa-ra n'otù ndi di egwu site na nmalite-ya ga n'iru; bú mba nātùta nāzọda kwa azọda, nke osimiri di iche iche kewaworo ala-ya, rue ọnọdu aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ugwu Zaion.
Mb͕e ọtutu ubọchi gasiri agēleta gi: n'ikpe-azu nke arọ ndia ka i gābà n'ala nke emeworo ka o si na mma-agha lata, nke achikọputaworo n'ọtutu ndi di iche iche, n'elu ugwu nile nke Israel, nke ghọworo nkpọnkpọ ebe mb͕e nile: ma emewo ala ahu ka o si n'etiti ndi di iche iche puta, ha gēbi kwa na ntukwasi-obi, ha nile.