Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 48:46 - Bible Nso

46 Ahuhu diri gi, Moab! ndi Kemosh alawo n'iyì: n'ihi na achiriwo umu-gi ndikom la na ndọta-n'agha, achiriwo kwa umu-gi ndinyom la na ndọta-n'agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

46 Ahụhụ dịrị gị, gị Moab! Ebibiela ndị Kemosh niile. A dọtakwala ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom nʼagha, buru ha gaa mba ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 48:46
7 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu Solomon wubere ebe di elu nye Kemosh, bú ihe-árú Moab, n'ugwu nke di n'iru Jerusalem, nye kwa Molek, bú ihe-árú umu Amon.


Ebe nile di elu nke di n'iru Jerusalem, nke di n'aka-nri ugwu nbibi, nke Solomon, bú eze Israel, wuru nye Ashtoret, bú ihe-árú ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú ihe-árú Moab, nye kwa Milkom, bú ihe-árú umu Amon, eze meru-kwa-ra ha.


O gēru kwa na, dika anu-ufe nke nēfefu efefu, dika akwu-nnunu achusara achusa, otú a ka umu-ndinyom Moab gādi na ngabiga-miri diri Anon.


Ihere Kemosh gēme kwa Moab, dika ihere Bet-el, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, mere ulo Israel.


N'ihi na ọ bu n'ihi na i tukwasiwo obi-gi n'ọlu-gi nile na n'àkù-gi nile ka agēwere kwa gi onwe-gi: Kemosh gāpu kwa so ndi gēje biri n'ala ọzọ, na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù.


Ahuhu gādiri gi, Moab! I lawo n'iyì, gi ndi Kemosh: Ọ nyewo umu-ya ndikom, dika ndi b͕apuru ab͕apu, Nye kwa umu-ya ndinyom ije na ndọta-n'agha, N'aka Saihon, bú eze ndi-Amorait.


Ọ̀ bughi ihe Kemosh, bú chi-gi, nēme gi ka i nweta, ka i gēnweta? Ma onye ọ bula Jehova, bú Chineke - ayi, napuworo ala-ya n'iru ayi, nke ahu ka ayi gēnweta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan