Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 48:40 - Bible Nso

40 N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, dika ugo ka ọ gēfesi ike, b͕asa nkù-ya abua rue Moab.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 48:40
11 Iomraidhean Croise  

Uzọ ugo n'elu-igwe; Uzọ agwọ n'elu oké nkume; Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri; Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ.


Ha gēfedakwasi n'ubu ndi Filistia n'Ọdida-anyanwu; ha abua gādi n'otù luta ihe umu Iru-anyanwu n'agha: n'aru Edom na Moab ka ha ganēseti aka-ha; umu Amon ganānu kwa olu-ha.


ọ gēruru kwa ba na Juda; ọ gēruchi, gabiga kwa; ọbuná n'olu ka ọ gēru; nsetipu nkù-ya abua gābu kwa ihe juputara obosara ala-gi, Immanuel.


Le, dika igwe-oji ka ọ nārigota, ọ bu kwa dika oké ifufe ka ub͕ọ-ala-ya nile di: inyinya-ya nile di garagara kari ugo. Ahuhu gādiri ayi! n'ihi na ebibiwo ayi.


Le, dika ugo ka ọ gārigo, fesie ike, b͕asa nkù-ya n'elu Bọzra: obi ndi-dike Edom n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.


Ndi nāchu ayi di garagara kari ugo nke elu-igwe: N'elu ugwu nile ka ha churu ayi n'ọku ọku, n'ọzara ka ha chere ayi anwu.


si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n'uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar:


Nke-mbu di ka ọdum, ọ nwe-kwa-ra nkù abua nke ugo: anọm nēle rue mb͕e ekwopuru nkù-ya abua, ewe si n'ala bulie ya elu, ọ bu kwa n'ukwu abua ka eguzobere ya ọtọ dika madu, ọ bu kwa obi madu ka enyere ya.


Tiye opì-ike n'okpo-ọnu-gi. Dika ugo ka ọ nābia megide ulo Jehova; n'ihi na ha agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, ọ bu kwa iwum ka ha jehieworo megide.


Inyinya-ha nile nwere ukwu nkọ kari agu, ha di kwa nkọ kari anu-ọhia wolf nke anyasi; ndi-inyinya-ha nāwuli kwa elu: e, ndi-inyinya-ha nēsi n'ebe di anya bia; ha nēfe dika ugo nke nēfe ngwa iri ihe.


Jehova gēsi n'ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bú mba nke i nānughi asusu-ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan