Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 48:38 - Bible Nso

38 N'elu-ulo nile nke Moab na n'amá-ya nile, n'ebe nile ọ bula, ka iti-aka-n'obi di: n'ihi na etiwawom Moab dika ihe nātọghi utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

38 Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 48:38
13 Iomraidhean Croise  

I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha; Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.


N'èzí-ya nile ka ha keworo ákwà-nkpe: n'elu ulo-ya nile na n'amá-ya nile ka onye ọ bula nākwasi ákwá ike, nākwab͕u onwe-ya.


Ibu eboro ndagwurugwu nke ọhù. Ọ bu kwa gini nēme gi, na i rigoworo n'elu ulo nile, ka i ra?


Ọ gētiwa kwa ya dika esi etiwa ite ndi-ọkpu-ite nākpu, nke etipiara etipia, Ọ gaghi-enwe ọmiko: ewe ghara ichọta n'etiti ntipia-ya otù ejùjù iji guru ọku n'okpukpo-ntu, ma-ọbu iji kupu miri n'ọdọ-miri.


I gētiwa kwa karama ahu n'anya ndikom ahu, bú ndi nēso gi je,


i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọbuna otú a ka M'gētiwa ndi nka na obodo a, dika madu si etiwa ite ọkpu-ite, nke anāpughi imezi kwa ya ọzọ: ọ bu kwa na Tofet ka ha gēlì ozu, n'ihi na ebe ilì ozu adighi.


Ọ̀ bu ite elelìri elelì nke etipiara etipia ka nwoke a, bú Konaia, bu? ọ̀ bu ihe nke nādighi-atọ utọ? gini mere eji tufu ha-ri, ya onye-ya na nkpuru-ya, tukwasi ha n'ala nke ha nāmaghi?


Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu: n'ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M'gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike.


Elodawo Israel: ub͕u a ha aghọwo ihe dika ihe nādighi-atọ utọ n'etiti mba nile.


Okwu M'nāgwa unu n'ọchichiri, kwuenu ya n'ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n'elu ulo.


ọ gewere kwa nkpa-n'aka ígwè zùa ha dika aturu, dika anākujisi ite nke ọkpu-ite; dika Mu onwem natawokwara n'aka Nnam:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan