Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 48:27 - Bible Nso

27 N'ihi na Israel, ọ̀ bughi ihe-ọchì ọ buru gi? ọ̀ bu n'etiti ndi-ori ka achọtara ya? n'ihi na ka mb͕e ra i nēkwu okwu bayere ya, i nēfufe isi-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị? Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya, mere i ji na-efufere ya isi mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 48:27
22 Iomraidhean Croise  

Ka mu onwem kwu kwa okwu dika unu; Ọ buru na nkpuru-obi-unu adi n'ọnọdu nkpuru-obim, M'gēnwe ike ijikọta okwu imegide unu, Na ifufe isim imegide unu.


I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ka ayi ghọrọ ndi di ayi buruburu ihe-ọchì na ihe-ikwa-emò.


Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha: Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya.


Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.


ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya.


Dika ihere onye-ori mb͕e anāchọputa ya, otú a ka emeworo ka ihere me ulo Israel; ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-aja-ha, na ndi-amuma-ha;


Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ? Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu, Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku.


Jerusalem echetawo n'ubọchi nile nke nweda-n'ala-ya na nke nwaghari-ya nile Ihe nile ya anāchọsi ike nke diri site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie: Mb͕e ndi-ya dabàra n'aka onye-nkpab͕u, ma ọ dighi onye nēyere ya aka, Ndi-nkpab͕u huru ya, ha chìri nkwusi-ya nile ọchì.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Moab na Sia nāsi, Le, ulo Juda di ka mba nile;


Dika i ṅuriri ọṅu n'isi ihe-nketa nke ulo Israel, n'ihi na ọ tọb͕ọrọ n'efu, otú a ka M'gēme gi: ebe tọb͕ọrọ n'efu ka i gābu, gi ugwu Sia, na Edom nile, ọbuná Edom nile: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na onye-iro asiwo megide unu, Ehe! na, Ebe di elu nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga aghọworo ayi ihe-nnweta:


n'ihi nka, unu ugwu Israel, nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ugwu nile na ugwu ntà nile na ebe nile miri si erù na ndagwurugwu nile na nkpọnkpọ ebe nile nke tọb͕ọrọ n'efu na obodo nile anapuru anapu, nke ghọwo-kwa-ra mba nile fọdurunu nke di buruburu ihe-nluta-n'agha na ihe-ikwa-emò:


Nka ka ha gēnwe n'ihi npako-ha, n'ihi na ha atawo ndi Jehova nke usu nile nke ndi-agha uta, me onwe-ha uku imegide ha.


Anuwom ita-uta Moab, na nkwulu nile nke umu Amon, nke ha jiworo ta ndim uta, me onwe-ha uku megide ókè-ala-ha.


N'oge hour ahu Jisus siri ìgwè madu ahu, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Kwa-ubọchi M'nọduru n'ulo uku Chineke nēzí ihe, ma unu ejideghm.


Mb͕e ahu akpọgidere ndikom abua tiyere Ya, bú ndi nāpunara madu ihe, otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe.


N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan