Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 48:14 - Bible Nso

14 Ùnu si aṅa si, Ndi-dike ka ayi bu, na ndi bu dìnkpà ibu agha?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ; anyị bụkwa dimkpa nʼagha’?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 48:14
12 Iomraidhean Croise  

Na Jehova ka m'b͕abàworo: Ùnu si aṅa si nkpuru-obim, Felaganu n'ugwu-unu dika nnunu?


Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa: Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike.


M'laghachiri, hu n'okpuru anyanwu, na ọ bughi ndi nwere ukwu ọsọ ka iwu-ọsọ diri, ọ bughi kwa ndi di ike ka agha diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi mara ihe ka nri diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-nghọta ka àkù diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-ǹkà ka amara diri; kama mb͕e na ihe-ndaputa nādabàra ha nile.


N'ihi na ọ siwo, Site n'ike akam ka m'meworo ya, na site n'amam-ihem; n'ihi na enwerem nghọta: m'we wezuga ókè ndi nile di iche iche, ọzọ, ihe-ha nke ejikereworo ka m'punara ha, m'we buda, dika onye di ike, ndi nānọdu n'ọche-eze;


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, gēziga ọtita-aru n'etiti ndi-ya mara abuba: ọ bu kwa n'okpuru nsọpuru-ya ka agāmuye nmuye dika nmuye nke ọku.


Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere nganga-ya, na npako-ya, na nrubiga-ókè-iwe-ya; ihe nēzighi ezi ka ekwukwu-ya nile bu.


Idi-egwu-gi, nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume ahu di elu, onye nējide ebe di elu nke ugwu ntà: n'ihi na asi na i me akwu-gi ka ọ di elu dika nke ugo, M'gēme ka i si n'ebe ahu ridata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ùnu si aṅa si, Ndi mara ihe ka ayi bu, iwu Jehova di kwa n'aka ayi? Ma otú o di, le, okwu-ugha ka pen ugha nke ndi-ode-akwukwọ meworo ya.


Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:


Otú a ka Jehova siri: Ndi nākwagide Ijipt gāda kwa, npako nke ike-ya gārida kwa: site na Migdol rue Sevene, ọ bu site na mma-agha ka ha gāda nime ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Nka ka ha gēnwe n'ihi npako-ha, n'ihi na ha atawo ndi Jehova nke usu nile nke ndi-agha uta, me onwe-ha uku imegide ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan