Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 46:7 - Bible Nso

7 Ònye bu onye a? dika osimiri Nail ka ọ nērú, dika osimiri ka miri-ya nile nāmaghari.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “Onye bụ onye a, nke na-ebili ọtọ dịka osimiri Naịl, na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 46:7
11 Iomraidhean Croise  

Ọnye bu nka nke nēsi n'ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku, Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense, Site n'ihe nile egwere egwe nke onye-ahia?


Ònye bu nwayi a nke nēsi n'ọzara arigota, Dabere n'aru onye ihe-ya nātọ ya utọ? N'okpuru osisi apple ka m'kpọtere gi: N'ebe ahu ka ime gi nēme nne-gi, N'ebe ahu ka ime nēme ya, o we muputa gi.


Ònye bu nka nēsi n'Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n'uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n'iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, di ike izọputa.


Otú a ka Jehova siri: Le, miri nēsi n'Ugwu erú, ha gāghọ kwa miri-iyi nērubiga ókè, ha gērusa kwa ala na ùjú-ya, na obodo na ndi bi nime ya: madu ewe tie nkpu, ndi nile bi n'ala ahu gākwasi kwa ákwá ike.


Nwa nke madu, buliere Fero, bú eze Ijipt, abù-ákwá, si ya, Nwa-ọdum nke mba nìle ka i yiworo: ma gi onwe-gi di ka ogologo anu n'oké osimiri nile; i we waputa n'osimiri-gi nile, ji ukwu-gi, b͕arua miri, zọrua osimiri nile ha.


Ma umu-ya ndikom gākpali onwe-ha ibu agha, ha gāchikọta kwa ìgwè ọtutu usu-ndi-agha, ọ gābia abia, rubiga ókè dika osimiri, gabiga: ọ gālaghachi kwa, ha gākpali kwa onwe-ha ibu agha rue ebe-ya siri ike.


Ma ogwe-aka nile nke nrubiga-ókè ahu ka agēji ruchapu ha n'iru ya, tipia ha; e, onye-ndú nke ọb͕ub͕a-ndu kwa.


Ma mb͕e ọgu ízù atọ na abua ahu gasiri agēbipu onye etere manu, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe: ọ bu kwa obodo ahu na ebe nsọ ahu ka ndi nke otù onye-ndú nke gaje ibia gēbibi; ma ọgwugwu-ya gādi na nrubiga-ókè dika nke miri, ọ bu kwa rue ọgwugwu mb͕e ahu ka agha gādi; ihe akara àkà bu itọb͕ọrọ-n'efu di iche iche.


Ala, ọ̀ gaghi-ama jijiji n'ihi nka? onye ọ bula nke bi nime ya, ọ̀ gaghi-eru kwa újú? e, ọ gērujucha dika osimiri Nail; ọ gāmaghari amaghari kwa, tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt.


Agwọ ahu we b͕uputa miri n'ọnu-ya n'azu nwanyi ahu dika osimiri, ka o we me ka osimiri ahu bupu ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan