Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 46:4 - Bible Nso

4 Kegidenu inyinya n'ub͕ọ-ala, rikwasinu, unu ndi-inyinya, guzo-kwa-nu onwe-unu nēkpu okpu-agha; richanu ube-unu, yirinu uwe-agha-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Kegidezienụ ịnyịnya unu, rịkwasịkwanụ nʼelu ha. Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu, ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu. Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ, yikwasịkwanụ uwe agha unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 46:4
11 Iomraidhean Croise  

Uzaia we doziere ha, bú usu-ndi-agha nile, ọta, na ube, na okpu-agha, na uwe-agha, na ute, ọbuná rue nkume èbè.


O rue, site n'ubọchi ahu, na nkera ndi nējerem ozi nālu ọlu n'ije-ozi ahu, ma nkera nime ha nēji ube na ọta na uta na uwe-agha; ndi-isi nọ kwa n'azu ulo Juda nile.


Jọnu njọ, unu ndi di iche iche, ma agētipia unu; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile nọ n'ebe di anya nke uwa: kenu ihe n'úkwù-unu, ma agētipia unu; kenu ihe n'úkwù-unu, ma agētipia unu.


Gosinu n'Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n'ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.


Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n'ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


Ka okwe-uta kwe uta-ya n'ebe onye nēkwe uta nọ, na n'ebe onye nēweli onwe-ya elu n'uwe-agha-ya nọ: unu enwe-kwa-la ọmiko n'aru umu-okorọbia-ya; wezuganu usu-ndi-agha-ya nile ka ebibie ya.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, si, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere umu Amon, baye-kwa-ra ita-uta-ha, si; gi si kwa, Le, mma-agha, bú mma-agha nke amiputaworo, n'ihi ob͕ub͕u ka emere ya ka ọ nēb͕u maramara, otú ọ gēkwe ya inagide, ka o we di ka àmùmà:


Kpọsanu nka n'etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota.


Sọl we yikwasi Devid uwe-nwuda-ya, kpukwasi okpu-agha ọla n'isi-ya, yikwasi ya uwe-agha.


Okpu-agha ọla di kwa n'isi-ya, ọ bu kwa uwe-agha emere dika akpirikpa-azù ka eyikwasiri ya; ọtùtù uwe-agha ahu di nnù shekel ọla iri-na-abua na ọgu iri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan