Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 46:26 - Bible Nso

26 M'gēnye kwa ha n'aka ndi nāchọ ndu-ha, na n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-orù-ya: ma emesia agēbi ya, dika o si di n'ubọchi nile nke mb͕e ochie; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 46:26
7 Iomraidhean Croise  

M'gēmechibido Ijipt n'aka onye-nwe-ha nēme ihe-ike; eze di ike gāchi kwa ha, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.


otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje inye Fero Họfra, bú eze Ijipt, n'aka ndi-iro-ya, na n'aka ndi nāchọ ndu-ya; dika M'nyere Zedekaia, bú eze Juda, n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, bú onye-iro-ya, nke nāchọ kwa ndu-ya.


Ma M'gēme ka ndi Moab adọtara n'agha laghachi n'ikpe-azu nke ubọchi nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Rue ebe a bu ikpé Moab.


Ma o gēru, n'ikpe-azu nke ubọchi nile, na M'gēme ka ndi Ilam adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mma-agha nke eze Babilon gābiakwasi gi.


N'ubọchi ahu ka M'gēguzobe ulo-ntu Devid ọtọ, bú nke dara ada, M'gēmechi kwa ntipú-ya nile; ọ bu kwa ebe-ya nile kwaturu akwatu ka M'gēguzobe ọtọ, wulie ya dika n'ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan