Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 46:25 - Bible Nso

25 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iji nmehie-ha leta Amon nke No, leta kwa Fero, leta kwa Ijipt, leta kwa chi-ya nile, leta kwa ndi-eze-ya; ọbuná Fero, na ndi nātukwasi ya obi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 46:25
16 Iomraidhean Croise  

M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova.


Ibu eboro Ijipt. Le, n'igwe-oji nke nāb͕a ọsọ ka Jehova nānọkwasi dika inyinya, O we bia rue Ijipt: ihe-efu nile nke Ijipt gēme kwa nkpatu n'iru Ya, obi Ijipt gālọ kwa ya miri n'etiti ya.


otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje inye Fero Họfra, bú eze Ijipt, n'aka ndi-iro-ya, na n'aka ndi nāchọ ndu-ya; dika M'nyere Zedekaia, bú eze Juda, n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, bú onye-iro-ya, nke nāchọ kwa ndu-ya.


Kwasie ákwá ike, gi Heshbon, n'ihi na apunarawo Ai ihe-ya; tienu nkpu, unu umu-ndinyom nke Raba, kenu ákwà-nkpe n'úkwù: tienu aka n'obi, b͕aghari-kwa-nu n'ogige nile unu; n'ihi na Malkam gāla n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide Fero, bú eze Ijipt, M'gāb͕aji kwa ogwe-aka-ya abua, ma nke siri ike, ma nke b͕ajiri ab͕aji; M'gēme kwa ka mma-agha-ya si n'aka-ya da.


Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan