Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 46:21 - Bible Nso

21 Ọzọ, ndi-ya egoro agha ndi nọ n'etiti ya di ka umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba; n'ihi na ha onwe-ha elewo anya n'azu, ha ab͕alagawo n'otù, ha eguzogh: n'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha abiakwasiwo ha, bú mb͕e nleta-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha dịka ụmụ ehi gbara abụba. Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ, ha agaghị eguzo, nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha, bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 46:21
25 Iomraidhean Croise  

Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri.


N'ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi.


Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì: N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia


Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n'anya di n'ebe ahu, Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya.


Ọ̀ bu kwa gini ka unu gēme n'ubọchi nleta, na n'ila-n'iyì nke gēsi n'ebe di anya bia? Ònye ka unu gāb͕akuru ka o we yere unu aka? ọ̀ bu kwa ole ebe unu gārapu nsọpuru-unu?


Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n'abuba.


Dika ifufe Iru-anyanwu ka M'gāchusa ha n'iru onye-iro; azu, ọ bughi iru, ka M'gēme ka hu ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.


Olu-ya di ka mkpatu agwọ mb͕e ọ nāga; n'ihi na ha gāchiri usu-ndi-agha je ije, ha achiriwo kwa anyu-ike biakute ya, dika ndi-ọwa-nkú.


Gini mere m'huworo ya? ndi ahu nātu ujọ b͕aghachi azu; anētipia kwa ndi-dike-ya, ha ab͕alagawo kwa ngwa ngwa, we ghara ile anya n'azu: egwu di buruburu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Rigonu, unu inyinya; kpọtuanu nkpọtu, unu ub͕ọ-ala; ka ndi-dike puta kwa: Kush na Put, ndi nēji ọta; na Ludim, ndi nēji nāzọ kwa uta ukwu ikwe ya.


Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


B͕alaganu, chigharia, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Dedan; n'ihi na nhuju-anya Isọ ka M'gēme ka ọ biakwasi ya, mb͕e M'gēleta ya.


N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;


Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n'ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide Fero, bú eze Ijipt, M'gāb͕aji kwa ogwe-aka-ya abua, ma nke siri ike, ma nke b͕ajiri ab͕aji; M'gēme kwa ka mma-agha-ya si n'aka-ya da.


N'ihi na i nwere iro ebighi-ebi, we rara umu Israel nye n'aka mma-agha na mb͕e nhuju-anya-ha, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu:


Ubọchi nile nke nleta abiawo, ubọchi nkwughachi abiawo; Israel gāma ya: onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka onye-amuma bu, onye-ara ka onye nwere Mọ Chineke bu, n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, na n'ihi na ihe bara uba ka ikpọ-asì ahu bu.


ndi nēdina n'elu ihe-ndina ọdú, nēseti kwa onwe-ha n'elu ebe-ndina-ha, nēri kwa umu-aturu ọma sitere n'ìgwè ewu na aturu, na umu-ehi site n'etiti ulo ebe anēme ka anu ma abuba;


Abàla n'ọnu-uzọ-ama ndim n'ubọchi nhuju-anya-ha; gi onwe-gi elekwasi-kwa-la ihe ọjọ ha anya n'ubọchi nhuju-anya-ha, unu atukwasi-kwa-la aka n'àkù-ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.


Onye nke ha nke kachasi nma di ka uke: onye ziri ezi jọrọ njọ kari ogige ogwu: ubọchi ndi-nche-gi, bú nleta-gi, abiawo; ub͕u a ka mb͕e ib͕a ha ghari gādi.


Ọzọ, o zipuru ndi-orù ọzọ, si, Gwa ndi akpọrọri, si, Le, edozisiwom oririm: eb͕usiwo oke-ehim nile na anum nile azùru azù, edozisiwo ihe nile: bianu n'oriri ọlulu-nwunye nkem.


Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan