Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 46:20 - Bible Nso

20 Nwa-ab͕ọghọ-ehi mara nma nke-uku ka Ijipt bu; odudo nke sitere n'Ugwu abiawo, ọ biawo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 “Ijipt mara mma dịka nne ehi, ma ijiji nke si nʼakụkụ ugwu, na-abịa imegide ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 46:20
8 Iomraidhean Croise  

Jehova we sim, N'Ugwu ka agēsi tọpu ihe ọjọ idakwasi ndi nile bi n'ala nka.


le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.


Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis.


Agēme ka ihere me ada Ijipt; agēnye ya n'aka ndi Ugwu.


Ka onye nwere ukwu ọsọ ghara ib͕alaga, ka dike ghara kwa iwepuga onwe-ya; n'Ugwu n'akuku osimiri Yufretis ka ha suru ngọngọ, da.


Otú a ka Jehova siri: Le, miri nēsi n'Ugwu erú, ha gāghọ kwa miri-iyi nērubiga ókè, ha gērusa kwa ala na ùjú-ya, na obodo na ndi bi nime ya: madu ewe tie nkpu, ndi nile bi n'ala ahu gākwasi kwa ákwá ike.


N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;


Efraim bu kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke emeworo ka ọ muta ihe, nke nāhu izọcha ọka n'anya; ma Mu onwem agabigawo n'elu olu-ya di nma: M'gēme ka anọkwasi Efraim dika inyinya; Juda gādọ ihe eji gwu ala-ubi, Jekob gētipiara ya ájá.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan