Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 46:19 - Bible Nso

19 Mere onwe-gi ihe nile iji je biri n'ala ọzọ, gi ada nēbi n'Ijipt: n'ihi na Nof gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, esuresiwo kwa ya ọku, o we ghara inwe onye-obibi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ, unu ndị bi nʼIjipt, nʼihi na a ga-eme ka Memfis ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 46:19
14 Iomraidhean Croise  

Ndi-isi Zoan aghọwo ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, arafuwo ndi-isi Nof; ha edufuwo Ijipt, bú ndi ahu nke bu nkume nkuku nke ebo-ya nile.


otú a ka eze Asiria gēdulaga ndi Ijipt adọtara n'agha, na ndi Etiopia emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma umu ntà ma ndi-okenye, b͕ara ọtọ na ukwu efu, b͕a kwa ọtọ n'otule, ib͕aba Ijipt ọtọ.


Gini mere i buworo amuma n'aha Jehova, si, Ulo a gādi ka Shailo, obodo a gābu kwa nkpọnkpọ ebe, ghara inwe onye-obibi? Ewe kpọkọta ndi Israel nile n'ebe Jeremaia nọ n'ulo Jehova.


Le, M'gaje inye iwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me ka ha biaghachi n'obodo a; ha gēbuso kwa ya agha, were ya, sure ya n'ọku: ọ bu kwa obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi-Ju nile ndi bi n'ala Ijipt, ndi bi na Migdol, na nime Tahpanhes, na nime Nof, na n'ala Patros, si,


Gosinu n'Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n'ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.


Si na nsọpuru-gi rida, nọdu ala n'akpiri-ikpọ-nku, gi ada nke bi na Dibon; n'ihi na onye nāpunara Moab ihe-ya arigowo imegide gi, o biliwo ebe-gi nile ewusiri ike.


Ọ dighi ukwu madu gāgabiga nime ya, ọ dighi kwa ukwu anumanu gāgabiga nime ya, agaghi-ebi kwa nime ya ọgu arọ abua.


M'gēme kwa ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n'efu n'etiti ala nile tọb͕ọrọ n'efu, ọzọ, obodo-ya nile nke di n'etiti obodo nile nke emeworo nkpọnkpọ ebe gābu ebe tọb͕ọrọ n'efu ọgu arọ abua: M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa ha n'ala nile.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka arusi nile la n'iyì, M'gēme kwa ihe-efu nile kwusi na Nof; ọ dighi kwa onye-isi gēsi n'ala Ijipt puta ọzọ: M'gētiye kwa egwu n'ala Ijipt.


N'ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n'ulo-ikwū nile ha.


Ahuhu diri ndi bi n'akuku oké osimiri, bú mba ndi Keret! Okwu Jehova nēmegide unu, Kenean, ala ndi Filistia; M'gēme kwa ka i la n'iyì ghara inwe onye-obibi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan