Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 46:12 - Bible Nso

12 Mba nile anuwo ihere-gi, iti-nkpu-gi juputa-kwa-ra uwa: n'ihi na dike asukwasiwo dike ngọngọ, n'otù ka ha dakọworo, ha abua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị. Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị. Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya; ha abụọ na-adakwa nʼala.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 46:12
17 Iomraidhean Croise  

Ọ bu nání na ọ makpuworo n'ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n'ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


M'gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze.


Iti-nkpu di n'èzí nile n'ihi manya-vine ahu; ọṅù nile ab͕achiwo, emewo ka obi-utọ nke uwa je biri n'ala ọzọ.


Juda eruwo újú, ọnu-uzọ-ama-ya nile atalatawo kwa, ha yiri uwe-nkpe nọdu n'ala; iti-nkpu Jerusalem arigowo.


Gini mere i ji kpaghari nke-uku ib͕anwe uzọ-gi? ihere Ijipt gēme kwa gi, dika ihere Asiria mere gi.


Ka onye nwere ukwu ọsọ ghara ib͕alaga, ka dike ghara kwa iwepuga onwe-ya; n'Ugwu n'akuku osimiri Yufretis ka ha suru ngọngọ, da.


Otú a ka Jehova siri: Le, miri nēsi n'Ugwu erú, ha gāghọ kwa miri-iyi nērubiga ókè, ha gērusa kwa ala na ùjú-ya, na obodo na ndi bi nime ya: madu ewe tie nkpu, ndi nile bi n'ala ahu gākwasi kwa ákwá ike.


Site n'iti-nkpu Heshbon rue Eleale, rue Jehez ka ha mere ka olu-ha da, site na Zoa rue Horonaim, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na ọbuná miri Nimrim gāghọ nání ebe tọb͕ọrọ n'efu.


Site n'olu nke ọdida-ha uwa mara jijiji; iti-nkpu di, n'Oké Osimiri Uhie ka anuru olu-ya.


Site n'olu nke owuwe Babilon uwa mara jijiji, anuwo kwa iti-nkpu n'etiti mba nile.


Ge nti olu iti-nkpu sitere na Babilon, na olu ntipia uku sitere n'ala ndi Kaldea!


Ọ nēcheta ndi-ebube-ya: ha su ngọngọ n'ojije-ha, me ngwa ijeru mb͕idi obodo, ma edoziwo ihe-nkpuchi ndi nānọchigide ya n'agha.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na olu iti-nkpu gēsi n'ọnu-uzọ-ama azù da, ya na ikwasi-ákwá-ike site n'obodo nke-abua, na oké ntiwa site n'ugwu ntà nile.


Ndikom kwa ndi nānwughi, ewere emerod tib͕ue ha: ntiku obodo ahu we rigorue elu-igwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan