Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 46:1 - Bible Nso

1 Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere mba nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya onye amụma ntị, banyere mba dị iche iche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 46:1
13 Iomraidhean Croise  

Site na ndia ka ekesara ala nile di oké osimiri buruburu nke mba nile, n'ala nile ha, onye ọ bula dika asusu-ya si di; dika ab͕uru-ha nile si di, nime mba nile ha.


le, emewom gi ta ka i lekọta mba nile, lekọta kwa ala-eze nile, iropu, na ikwada, na ime ka ha la n'iyì, na itikpọ, na iwu ulo, na iku ihe.


Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Ọ gābia kwa, tib͕ue ala Ijipt; ndi diri ọnwu ka agēnye n'ọnwu, ndi diri ndọta-n'agha ka agēnye na ndọta-n'agha, ndi diri mma-agha ka agēnye na mma-agha.


N'arọ nke-iri, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa ahu, okwu Jehova rurum nti, si,


Okwu Jehova we ruem nti, si,


O rue, n'arọ nke-iri-na otù, n'ọnwa nke-atọ, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,


O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,


Ọ̀ gēwere n'ihi nka nāwupu eriri-ya, ghara inwe ọmiko n'ib͕u mba di iche iche mb͕e dum?


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.


N'ihi na n'elu oké nkume ndia ka m'si ahú ya, Ọ bu kwa n'ugwu ntà ndia ka m'si ekiri ya: Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche, Ọ dighi-agu onwe-ya n'etiti mba nile.


Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ bu Chineke nke nání ndi-Ju? Ọ̀ bughi kwa Chineke nke ndi mba ọzọ? E, ọ bu kwa nke ndi mba ọzọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan