Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 45:3 - Bible Nso

3 I siri, Biko, ahuhu nādirim! n'ihi na Jehova atukwasiwo ihe-nwuta n'elu ihe-nb͕um; adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem, ma achọtaghm izu-ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ị sịrị, ‘Ahụhụ dịịrị m! Lee na Onyenwe anyị atụkwasịrịla m mwute nʼelu ihe mgbu nke m nwere. Ike ịsụ ude agwụla m, ma ruo ugbu a, achọtabeghị m izuike.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 45:3
28 Iomraidhean Croise  

Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu: Akam di arọ́ n'ihi ize-umem.


Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek, Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida!


M'gēme aṅa ma asi na ekweghm na m'gēle idi-nma Jehova N'ala ndi di ndu?


Ob͕u-miri nākpọ ob͕u-miri òkù n'olu nrùda-miri nile nke Gi: Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile agabigawo n'isim.


Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem; Kwa-abali ka m'nēme ka ihe-ndinam se n'elu anya-mirim; Ejim anya-mirim de ihe m'ji edina.


Anyam emebiwo site na nkpasu-iwem dika uwe nla mebiri; Ọ kawo nká n'hi ndi-nkpab͕um nile.


Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku: Anyam abua adalawo n'isi, mb͕e m'nēchere Chinekem.


Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu, Ike-gi pere npe.


Okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere gi, Beruk, si:


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n'arum ka aru nādighi obim ike.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na isim bu miri miri, asi anyam abua bu isi-iyi nke anya-miri, ka m'we kwa ákwá n'ehihie na abali bayere ndi eb͕uru eb͕u nke ada ndim!


N'elu ka O siri zite ọku n'ọkpukpum nile, o we nwe ike n'aru ha: Ọ b͕asaworo ukwum abua ub͕u, O mewo ka m'laghachi azu; O mewom ka m'ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na onye aru nādighi ike ogologo ubọchi nile.


Ka ihe ọjọ nile ha bia n'iru Gi; Gi me kwa ha, dika I meworom n'ihi njehiem nile: N'ihi na ize-umem di ọtutu, aru adighi kwa obim ike.


N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.


N'ihi nka, ebe ayi nwere ije-ozi a, dika emere ayi ebere, ike agwughi ayi n'obi:


N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi.


Ma ike agwula ayi n'obi n'ime ihe ọma: n'ihi na ayi gēweta ihe-ubi mb͕e oge-ya ruru, ma ayi adaghi #mbà.


Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ike agwula unu n'obi n'ime ihe ọma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan