Jeremaya 44:8 - Bible Nso8 n'iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n'isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n'etiti mba nile nke uwa? Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 Gịnị mere unu na-eji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe, na-esurere chi ndị ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼala Ijipt, ebe unu bịara ibi? Unu onwe unu ga-ala onwe unu nʼiyi, mekwaa onwe unu ihe ịbụ ọnụ nakwa ihe nkọcha nʼetiti mba niile dị nʼụwa. Faic an caibideil |
N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.
M'gēwere kwa ndi Juda fọduru, bú ndi doworo iru-ha ibà n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, agēme kwa ka ha nile gwusia; n'ala Ijipt ka ha gāda; site na mma-agha na site n'oké unwu ka agēme ka ha gwusia: ha gānwu, site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, site na mma-agha na site n'oké unwu: ha gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta.