Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 44:7 - Bible Nso

7 Ma ub͕u a otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ìhi gini ka unu onwe-unu nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi unu, ibipu n'ulo-unu nwoke na nwanyi na nwatakiri na nwa nāṅu ara, ka ha pua n'etiti Juda, ewe me ka ọ ghara idi ndi fọduru gāfọduru unu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “Ma ugbu a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Nʼihi gịnị ka unu ji chọọ iji aka unu wetara onwe unu ihe ọjọọ ndị a? Lee ka unu si duru ndị ikom na ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile, na ụmụ a mụrụ ọhụrụ niile na-agbala nʼala Ijipt, si otu a mee ka, ọ bụladị, otu mkpụrụ mmadụ hapụ ịfọdụkwa nʼala Juda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 44:7
28 Iomraidhean Croise  

Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu, Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.


Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya: Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe.


Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu, Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike.


Ma onye nēmehie megidem nēme nkpuru-obi-ya ihe-ike: Ndi nile nke nākpọm asì nāhu ọnwu n'anya.


unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha na ikpọ isi ala nye ha, unu eji-kwa-la ọlu aka-unu kpasum iwe; M'gaghi-eme kwa unu ihe ọjọ.


Ma egeghm nti, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka unu we were ọlu aka-unu kpasuem iwe, ime onwe-unu ihe ọjọ.


Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi.


Ma ihe-ihere ahu erichapuwo ihe putara na ndọb͕u nna-ayi-hà dọb͕uru onwe-ha n'ọlu site na mb͕e ayi di na nwata; ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom.


Jeremaia we si Zedekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, siri: Ọ buru na i gāpukuru ndi-isi eze Babilon n'ezie, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu, agaghi-esure kwa obodo a n'ọku; i gādi kwa ndu, gi onwe-gi na ulo-gi:


N'ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n'ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya:


ọ gaghi-adi kwa onye-nb͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu ndi Juda fọduru gēnwe, bú ndi bataworo n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ọbuná ilaghachi n'ala Juda, nke ha onwe-ha nāchọ si-ike ilaghachi ibi n'ebe ahu: n'ihi na ọ dighi onye gālaghachi ma-ọbughi ndi b͕apuru ab͕apu.


n'iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n'isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n'etiti mba nile nke uwa?


ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia nwoke na nwanyi; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia agadi-nwoke na nwa-okoro; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia nwa-okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke;


Ọ̀ bu Mu ka ndi ahu nākpasu iwe? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ọ̀ bughi ha onwe-ha ka ha nākpasu iwe, ka ihere we me ha n'iru?


N'ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n'ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n'èzí, na umu-okorọbia n'amá nile.


Anyam abua adalawo n'isi site n'anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku, Awusiwo umejum n'ala dika miri, n'ihi ntipia nke ada ndim; N'ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n'amá nile nke obodo.


I nākpọ, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà, ujọm nile di buruburu, Ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu n'ubọchi nke iwe Jehova: Umum ndi m'tughariworo n'aka zulite, onye-irom emewo ka ha gwusia.


Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?


b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu.


I duworo ulo-gi ọdu ihere, ibipu ọtutu ndi di iche iche, i we nēmehie megide nkpuru-obi-gi.


bú ihe-igu-ọku nke ndi-nmehie ndia ndi megidere nkpuru-obi-ha, ka ewere kwa ha kpu mbadamba ihe ibu ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà: n'ihi na ha wetara ha nso n'iru Jehova, ha di kwa nsọ: ha gābu-kwa-ra umu Isael ihe-iriba-ama.


Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí, Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile; Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.


Ha we were ọnu mma-agha wezuga ihe nile di n'obodo ahu ka ebibie ya, ma nwoke ma nwayi, ma nwata ma okenye, na ehi, na aturu, na inyinya-ibu.


Nka bu kwa ihe unu gēme; unu gēwezuga nwoke ọ bula na nwayi ọ bula nke mara ndina nwoke, ka ebibie ya.


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


O were kwa ọnu mma-agha tib͕ue Nob, bú obodo ndi-nchu-àjà, were ọnu mma-agha tib͕ue ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, na ehi na inyinya-ibu na aturu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan