Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 44:28 - Bible Nso

28 Ma ndi b͕apuworo na mma-agha gēsi n'ala Ijipt laghachi n'ala Juda, ndikom ole-na-ole; ndi Juda nile fọduru, bú ndi biaruworo ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ewe mara onye okwu-ya gēguzosi ike, nkem, ma-ọbu nke ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Naanị mmadụ ole na ole ga-esi Ijipt gbalata Juda ịgbanarị mma agha. Mgbe ahụ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ ndị bịara biri nʼIjipt, ga-amata onye okwu ya na-eguzosi ike, maọbụ nke m, maọbụ nke ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 44:28
20 Iomraidhean Croise  

Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi, Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile.


Ma osisi nke fọduru n'oké ọhia-ya gādi ole-na-ole n'ọnu-ọgugu, nwata gēdeta kwa ha n'akwukwọ.


N'ihi na ọ buru na ndi-gi, Israel, adi ka ájá oké osimiri, nání ndi fọduru nime ha gālata: nkpochapu ka akaworo àkà, nke nērubiga ókè n'ezi omume.


Ọ bu kwa otú a ka ndikom ahu nile gādi, bú ndi doworo iru-ha ibà n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu; ha gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ha agaghi-enwe kwa ndi fọduru ma-ọbu ndi b͕apuru ab͕apu n'iru ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ha.


M'gēji kwa nmehie nke ndi bi n'ala Ijipt leta ha, dika M'jiworo nmehie nke Jerusalem leta ya, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe:


ọ gaghi-adi kwa onye-nb͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu ndi Juda fọduru gēnwe, bú ndi bataworo n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ọbuná ilaghachi n'ala Juda, nke ha onwe-ha nāchọ si-ike ilaghachi ibi n'ebe ahu: n'ihi na ọ dighi onye gālaghachi ma-ọbughi ndi b͕apuru ab͕apu.


Ma nka gāburu unu ihe-iriba-ama, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na Mu onwem nēji nmehie-unu leta unu n'ebe a, ka unu we mara na okwum nile aghaghi iguzosi ike imegide unu ime unu ihe ọjọ:


Unu ndi b͕apuworo na mma-agha, jenu, unu eguzola; chetanu Jehova site n'ebe di anya, ka Jerusalem bata kwa n'obi-unu.


Ma M'gēme ka madu ufọdu fọdu, ọ bu na unu gēnwe ndi b͕apuru na mma-agha n'etiti mba nile, mb͕e unu gāb͕asa n'ala nile.


Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.


Moses we si, N'ìhi gini kwa ka unu onwe-unu nāgabiga okwu-ọnu Jehova? ma nke ahu agaghi-aga nke-ọma.


Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan