Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 44:23 - Bible Nso

23 N'ihi na unu esurewo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, we ghara ige nti olu Jehova, ghara kwa ijeghari n'iwu-Ya, na n'ukpuru-Ya nile, na n'ihe-àmà-Ya nile; n'ihi nka ka ihe ọjọ a dakwasiworo unu, dika o si di ta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 44:23
24 Iomraidhean Croise  

Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke-ha, Onye mere ka ndi bu nna-ha si n'ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n'ihi ya ka Jehova meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha.


Ha we ju ukpuru-Ya nile, na ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na ndi bu nna-ha b͕ara, na ihe-àmà-Ya nile nke Ọ b͕ara ha; ha we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu, soro mba ọzọ ndi nọ ha buruburu, ndi Jehova nyere ha iwu bayere ha, ka ha ghara ime dika ha.


ha we nēme ndi-ozi Chineke ka ha buru ihe-ọchì, ha nēlelì kwa okwu-Ya anya, nēme kwa onwe-ha ndi-aghughọ n'ebe ndi-amuma-Ya nọ, rue mb͕e ọnuma Jehova lara elu imegide ndi-Ya, rue mb͕e ngwọta nādighi.


Ọ̀ bughi otú a ka nna-unu-hà mere, Chineke-ayi we me ka ihe ọjọ a nile biakwasi ayi, biakwasi kwa obodo a? ma unu onwe-unu nātukwasi ihe n'ihe di ọku di n'aru Israel, n'ime ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ.


Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.


Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ; Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya.


Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ; N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile.


Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke, Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya;


Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya, Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile;


I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu egeghm nti, ijehari n'iwum nke M'tiyeworo n'iru unu,


Jehova we me ka ọ bia, O we me dika O kwuru; n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, ma unu egeghi nti olu-Ya, n'ihi nka ka ihe a ruworo unu aru.


Azọpiaghi ha n'obi rue ta, ha atughi kwa egwu, ha ejegharighi kwa n'iwum, na n'ukpurum nile, nke M'tiyere n'iru unu na n'iru nna-unu-hà.


Ma site na mb͕e ayi rapuru isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nile akọwọ ayi, ọ bu kwa site na mma-agha na site n'oké unwu ka emeworo ka ayi gwusia.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu onwe-unu ahuwo ihe ọjọ ahu nile nke M'meworo ka ọ biakwasi Jerusalem, biakwasi kwa obodo nile nke Juda; ma, le, ha bu nkpọnkpọ ebe ta, ọ dighi kwa onye bi nime ha;


Ọ̀ bughi ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke unu surere n'obodo nile nke Juda na n'èzí nile nke Jerusalem, unu onwe-unu, na nna-unu-hà, na ndi-eze-unu, na ndi-isi-unu, na ndi ala ahu, ọ̀ bughi ihe ndia ka Jehova chetara, ihe ahu we bata n'obi-Ya?


n'ihi ihe ọjọ ha nke ha meworo ikpasum iwe, n'ije isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ifè chi ọzọ di iche iche, ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha, ma-ọbu unu onwe-unu, ma-ọbu nna-unu-hà.


n'iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n'isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n'etiti mba nile nke uwa?


Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú: Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya: E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.


Dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, ihe ọjọ a nile abiakwasiwo ayi: ma ayi emeghi ka iru Jehova, bú Chineke-ayi, dajua, ka ayi we si n'ajọ omume nile ayi chigharia, nwe uche n'ezi-okwu-Gi.


Kama okwu m'nēkwu bu, na ihe ndi mba ọzọ nāchu n'àjà, ha nāchuru ndi-mọ ọjọ, ọ bughi kwa Chineke ka ha nāchuru: ma achọghi m ka unu ghọ ndi unu na ndi-mọ ọjọ nēnwekọ.


Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n'ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M'gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M'gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan