Jeremaya 44:23 - Bible Nso23 N'ihi na unu esurewo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, we ghara ige nti olu Jehova, ghara kwa ijeghari n'iwu-Ya, na n'ukpuru-Ya nile, na n'ihe-àmà-Ya nile; n'ihi nka ka ihe ọjọ a dakwasiworo unu, dika o si di ta. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a23 Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.” Faic an caibideil |