Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 44:21 - Bible Nso

21 Ọ̀ bughi ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke unu surere n'obodo nile nke Juda na n'èzí nile nke Jerusalem, unu onwe-unu, na nna-unu-hà, na ndi-eze-unu, na ndi-isi-unu, na ndi ala ahu, ọ̀ bughi ihe ndia ka Jehova chetara, ihe ahu we bata n'obi-Ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 “Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 44:21
19 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?


Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi: Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi: N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.


Jehova, ewela iwe nke-uku, echeta-kwa-la ajọ omume rue mb͕e ebighi-ebi: le, biko, legide anya, ndi-Gi ka ayi nile bu.


N'ihi na ka ọnu-ọgugu obodo-gi ra, otú a ka chi-gi nile di, gi Juda; ka ọnu-ọgugu èzí Jerusalem ra kwa, otú a ka unu doworo ebe-ichu-àjà nye ihe-ihere ahu, bú ebe-ichu-àjà isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Otú a ka Jehova siri ndi nka, Ọbuná otú a ka ha huworo nwaghari n'anya; ha eb͕ochighi ukwu-ha: ihe-ha atọghi kwa Jehova utọ; ub͕u a ka Ọ nēcheta ajọ omume-ha, were nmehie-ha leta ha.


n'ihi ihe ọjọ ahu nile nke umu Israel na nke umu Juda, nke ha meworo ikpasum iwe, ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-àjà-ha, na ndi-amuma-ha, na ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem.


Kama ayi aghaghi ime okwu nile ọ bula nke puworo n'ọnu-ayi, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, dika ayi meworo, ayi onwe-ayi, na nna-ayi-ha, na ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: ayi we rijue nri afọ, aru adi ayi nma, ọ dighi kwa ihe ọjọ ayi huru.


Jeremaia we gwa ndi Israel nile, ma ndikom ma ndinyom, ọbuná ndi Israel nile ndi nāza ya okwu, si,


Ùnu echezọwo ihe ọjọ nile nke nna-unu-hà, na ihe ọjọ nile nke ndi-eze Juda, na ihe ọjọ nile nke ndinyom-ha, na ihe ọjọ nile nke unu, na ihe ọjọ nile nke ndinyom-unu, nke ha mere n'ala Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem?


na i wuworo onwe-gi ulo ikwa iko, me-kwa-ra onwe-gi ebe di elu n'amá nile ọ bula.


Ma ha adighi-asi n'obi-ha na ọ bu ihe ọjọ nile ha ka M'chetaworo: ub͕u a ka omume nile ha b͕aworo ha buruburu; na ncherita-irum ka ha di.


Jehova ejiwo npako Jekob ṅua iyi, si, Agaghm-echezọ ọlu nile ha ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.


Jehova we hu ya, we lelia ha anya, N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom.


Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ, Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm?


Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n'iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya.


n'ihi na nmehie-ya nile rapakọrọ n'otù rue elu-igwe, Chineke cheta-kwa-ra ajọ omume-ya nile.


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan