Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 44:15 - Bible Nso

15 Ndikom ahu nile ndi mara na ndinyom-ha nēsurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ndinyom nile ndi nēguzo n'ebe ahu, ọ bu nkpọkọta di uku, ọbuná ndi Israel nile ndi bi n'ala Ijipt, nime Patros, ha we za Jeremaia, si,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ndị nọ nʼebe ahụ mgbe ahụ Jeremaya kwuru okwu ndị a bụ ndị ikom ahụ niile maara na ndị nwunye ha na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, na ndị niile bi nʼIjipt nʼakụkụ Patros. Ndị a zara Jeremaya sị ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 44:15
14 Iomraidhean Croise  

Ma tutu ha edina, ndikom obodo ahu, bú ndikom Sọdọm, b͕ara ulo ahu buru-buru, ma okorọbia ma agadi, ndi ala ahu nile site n'akuku ọ bula;


Ọ̀ bughi n'ihe ndia ka Solomon, bú eze Israel, mehiere? ma n'etiti ọtutu mba ọ dighi eze di ka ya, onye Chineke huru n'anya ka ọ bu kwa, Chineke we me ya eze Israel nile: ọbuná onye ahu ka ndinyom ala ọzọ mere ka o mehie.


Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ: Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.


N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike.


M'we gosi gi ya site na mb͕e ochie; tutu o me emerem ka i nuru: ka i we ghara isi, Arusim emewo ha, ọ bu kwa arusim apiri api na arusim awuru awu nyere ha iwu.


Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti bayere ndi-Ju nile ndi bi n'ala Ijipt, ndi bi na Migdol, na nime Tahpanhes, na nime Nof, na n'ala Patros, si,


Ma mb͕e ayi onwe-ayi nēsurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāwusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bu mb͕e di-ayi nēkweghi ka ayi meworo ob͕e achicha nye ya ime onyinyo-ya, wusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu?


Jeremaia we si ndi Israel nile, si kwa ndinyom ahu nile, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile ndi nọ n'ala Ijipt:


M'gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n'agha laghachi, M'gēme kwa ka ha laghachi n'ala Patros, n'ala nputa-n'uwa-ha; ha ewe nọ n'ebe ahu, buru ala-eze di ala.


M'gēme kwa ka Patros tọb͕ọrọ n'efu, M'gētiye kwa ọku nime Zoan, me kwa ihe nile ekpere ikpe nime No.


Sinu n'ọnu-uzọ di warara bà: n'ihi na obosara ka ọnu-uzọ ahu di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà n'ila-n'iyì, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà.


ndi sitere na chi nile nke ndi nile nọ unu buruburu, ndi nọ nso gi, ma-ọbu ndi nọpuru gi n'ebe di anya, site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa);


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan