Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 44:13 - Bible Nso

13 M'gēji kwa nmehie nke ndi bi n'ala Ijipt leta ha, dika M'jiworo nmehie nke Jerusalem leta ya, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Dịka m si taa Jerusalem ahụhụ, otu a ka m ga-esi jiri mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, taa ndị ahụ bi nʼIjipt ahụhụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 44:13
11 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a, Le, M'gaje iwere nmehie-ha leta ha: umu-okorọbia-ha gānwu site na mma-agha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gānwu site n'oké unwu;


Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpu apu, nke nādakuru ndi Kaldea ndi nānọchigide unu n'agha, ọ gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata.


M'gēziga kwa mma-agha na oké unwu na ajọ ọria nēfe efe n'etiti ha, rue mb͕e agēme ka ha gwupusia n'elu ala ahu nke M'nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.


M'gēwere ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, iburu ha ihe ọjọ; ibu ihe-ita-uta, na ilu, na ihe-àkùkù, na ihe-nkọcha, n'ebe nile M'gāchusa ha.


ma ub͕u a n'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi Juda fọduru: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Ọ buru na unu onwe-unu edosie iru-unu ike ibà n'Ijipt, unu ewe ba inọ dika ọbìa n'ebe ahu;


ọ gēru kwa, na mma-agha ahu nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gēru unu aru n'ala Ijipt; ọzọ, oké unwu ahu, nke unu onwe-unu nātu egwu ya, n'ebe ahu ka ọ gārapara unu n'aru n'iso unu n'azu n'Ijipt; ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gānwu.


Ọ bu kwa otú a ka ndikom ahu nile gādi, bú ndi doworo iru-ha ibà n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu; ha gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ha agaghi-enwe kwa ndi fọduru ma-ọbu ndi b͕apuru ab͕apu n'iru ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ha.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.


Ọ gābia kwa, tib͕ue ala Ijipt; ndi diri ọnwu ka agēnye n'ọnwu, ndi diri ndọta-n'agha ka agēnye na ndọta-n'agha, ndi diri mma-agha ka agēnye na mma-agha.


N'ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n'ulo-ikwū nile ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan