Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 43:9 - Bible Nso

9 Were nkume di uku n'aka-gi, zobe ha n'urọ n'ebe ahu anākpu brick nke di n'ọnu-uzọ ulo Fero na Tahpanhes, n'anya ndi Juda;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Mgbe ndị Juu nọ na-ele gị anya, chịrị ụfọdụ nkume buru ibu nʼaka gị, gaa zoo ha nʼime ụrọ dị na mpụta ihu ụlọ e ji aja ụrọ wuo, nke dị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ Fero dị na Tapanhis.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 43:9
18 Iomraidhean Croise  

O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o tiye ha n'okpuru mma-nkwọ, na n'okpuru ígwè nēbì ihe, na n'okpuru anyu-ike ígwè, me kwa ka ha gabiga n'ihe eji akpu brick: otú a ka ọ nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem.


ha we were òfùfè siri ike me ka ndu-ha di ilu, n'urọ, na nime brick, na n'òfùfè nile ọ bula n'ọhia, òfùfè-ha nile nke ha mere ka ha fè nime ha di na nkpab͕u.


Fero, bú eze Ijipt, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ya nile;


si ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iziga kuru Nebukadreza, eze Babilon, bú orùm, dọkwasi oche-eze-ya n'elu nkume ndia nke m'zobeworo; ọ gēseti kwa ulo-ǹdò-ya n'elu ha.


Okwu Jehova we rue Jeremaia nti na Tahpanhes, si,


otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje inye Fero Họfra, bú eze Ijipt, n'aka ndi-iro-ya, na n'aka ndi nāchọ ndu-ya; dika M'nyere Zedekaia, bú eze Juda, n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, bú onye-iro-ya, nke nāchọ kwa ndu-ya.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n'onwe-gi otù brick, tọb͕ọ ya n'iru gi, kà otù obodo n'elu ya, bú Jerusalem:


Agwawokwam ndi-amumam okwu, ọ bu kwa Mu onwem mere ka ọhù ba uba; ọ bu kwa site n'aka ndi-amuma ka M'ji ihe ama àtù.


Sere onwe-gi miri nke nnọchigide-n'agha, me ka ebe-gi nile ewusiri ike sie ike: ba n'urọ, zọta ájá, jide ihe eji akpu brick.


O we biakute ayi, chiri ihe-ọkiké Pọl, ke onwe-ya ukwú na aka, si, Okwu ndia ka Mọ Nsọ kwuru, si, Otú a ka ndi-Ju ndi nọ na Jerusalem gēke nwoke nwe ihe-ọkiké a, ha gārara kwa ya nye n'aka ndi mba ọzọ.


Otù mọ-ozi nke di ike we būru nkume, dika oké nkume-igwe-nri, we tubà ya nime oké osimiri, si, Otú a ka agātuda Babilon, bú obodo uku ahu, n'oké ọdida, agaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan