Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 43:6 - Bible Nso

6 bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na umu-ndinyom eze, na madu ọ bula nke Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ọ nọdu n'aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, na Jeremaia, bú onye-amuma, na Beruk nwa Neraia;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ha duuru ndị ikom niile na ndị inyom niile na ụmụntakịrị niile, na ụmụ ndị inyom eze niile, bụ ndị ahụ Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze Babilọn tinyere na nlekọta Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan na Jeremaya onye amụma na Baruk nwa Neraya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 43:6
11 Iomraidhean Croise  

Le, ndinyom ahu nile ndi fọduru n'ulo eze Juda gābu ndi emeworo ka ha pukuru ndi-isi eze Babilon, ndinyom ahu ganāsi kwa, Ndi gi na ha di n'udo akpaliwo gi, we nwe ike n'aru gi: ukwu-gi abua emiwo n'apiti, ha we laghachi azu.


Ma Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ufọdu nime ndi Israel ndi nēnweghi ike, bú ndi nēnweghi ihe ọ bula, fọdu n'ala Juda, o we nye ha ubi-vine na ubi n'ubọchi ahu.


Ọzọ kwa, ndi-Ju nile ndi nọ na Moab, na n'etiti umu Amon, na n'Edom, na ndi nọ n'ala nile, nuru na eze Babilon enyewo Juda ndi fọduru, na o mewo kwa Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye-nlekọta-ha;


Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta n'ala-ha, na o me-kwa-ra ya onye-nlekọta nke ndikom na ndinyom na umu-ntakiri, bú ufọdu nime ndi nēnweghi ike n'ala, nime ndi anēmeghi ka ha je biri na Babilon;


Ishmael we dọta ndi Israel nile fọduru ndi nọ na Mizpa n'agha, bú umu-ndinyom eze, na ndi Israel nile fọduru na Mizpa, ndi Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta-ha: Ishmael nwa Netanaia we dọta ha n'agha, je igabigakuru umu Amon.


kama Beruk nwa Neraia nākpali gi imegide ayi, ka o we nye ayi n'aka ndi Kaldea, ka ha we me ka ayi nwua, me kwa ka ayi je biri na Babilon.


Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara Beruk nwa Neraia, mb͕e o dere okwu ndia n'akwukwọ site n'ọnu Jeremaia, n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,


Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n'anya-ya, ọ bu kwa ndi-isi nile nke Juda ka o b͕uru na Ribla.


Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.


N'ezie, n'ezie, asim i, Mb͕e i di n'okorọbia, i nēke onwe-gi ihe-ọkiké n'úkwù, nējeghari kwa ebe i nāchọ: ma mb͕e i gēme agadi, i gēseti aka-gi abua, onye ọzọ gēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, būru kwa gi ga ebe i nāchọghi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan