Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 43:3 - Bible Nso

3 kama Beruk nwa Neraia nākpali gi imegide ayi, ka o we nye ayi n'aka ndi Kaldea, ka ha we me ka ayi nwua, me kwa ka ayi je biri na Babilon.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Kama ọ bụ Baruk nwa Neraya na-akwalị gị megide anyị, nʼihi na ọ chọrọ inyefe anyị nʼaka ndị Babilọn ka ha gbuo anyị, maọbụ buru anyị gaa Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 43:3
12 Iomraidhean Croise  

N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem: Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere.


m'we were akwukwọ nzuta-ala ahu nye Beruk nwa Neraia, nwa Mahseia, n'anya Hanamel nwa nwa-nne nnam, na n'anya ndi-àmà ndi deworo aha-ha n'akwukwọ nzuta-ala ahu, n'anya ndi-Ju nile ndi nānọdu ala n'ogige ulo-nche ahu.


Beruk we gua n'akwukwọ ahu okwu nile nke Jeremaia n'ulo Jehova, n'ime-ulo Gemaraia nwa Shefan, bú ode-akwukwọ, n'ogige nke di n'elu, n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova, na nti ndi Israel nile.


Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.


Jeremaia we kpọ Beruk nwa Neraia; Beruk we dere n'ọnu Jeremaia okwu nile nke Jehova, nke Ọ gwara ya-ri, n'akwukwọ-npiakọta.


Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.


n'ihi ndi Kaldea: n'ihi na ha turu egwu ha, n'ihi na Ishmael nwa Netanaia etib͕uwo Gedalaia nwa Ahaikam, onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala-ha.


bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na umu-ndinyom eze, na madu ọ bula nke Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ọ nọdu n'aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, na Jeremaia, bú onye-amuma, na Beruk nwa Neraia;


Ahuhu gādiri unu, mb͕e ọ bula madu nile gēkwu okwu ọma bayere unu: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma ugha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan