Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 43:12 - Bible Nso

12 M'gēsuye kwa ọku n'olu nile nke chi nile nke Ijipt; o gēsure kwa ha ọku, dọta ha n'agha: ọ gēji kwa ala Ijipt kpuchie onwe-ya dika onye-ọzùzù-aturu si eji uwe-ya kpuchie onwe-ya; o gēsi kwa n'ebe ahu pua n'udo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ọ ga-esunyekwa ọkụ nʼụlọ ebe a nọ na-efe chi niile nke ndị Ijipt. Ọ ga-esure ụlọ ndị a ọkụ, dọtakwa chi ha niile nʼagha. Dịka onye ọzụzụ atụrụ si ewepụcha igwu site na uwe ya, ọ ga-esikwa otu a wezuga onwe ya nʼudo site nʼIjipt pụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 43:12
36 Iomraidhean Croise  

Ha we rapu arusi nile ha n'ebe ahu, Devid na ndikom-ya we chiri ha.


ka enye kwa uwe ahu na inyinya ahu n'aka otù nwoke nime ndi-isi eze, ndi bu eze, ka ha yikwasi kwa nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ, ka ha me kwa ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ka ha kpọ kwa n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.


Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma; Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi.


Gi Onye nēji ìhè kpuchi Onwe-gi dika uwe-nb͕okwasi; Onye nēseti elu-igwe dika ákwà-nkwuba:


Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà-ya ka M'gēyikwasi nzọputa dika uwe: Ndi-ebere-ya gētisi kwa nkpu ọṅù ike.


Ndi-iro-ya ka M'gēyikwasi ihere dika uwe: Ma n'isi-ya ka okpu-eze-ya gāb͕awa okoko.


M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova.


Ibu eboro Ijipt. Le, n'igwe-oji nke nāb͕a ọsọ ka Jehova nānọkwasi dika inyinya, O we bia rue Ijipt: ihe-efu nile nke Ijipt gēme kwa nkpatu n'iru Ya, obi Ijipt gālọ kwa ya miri n'etiti ya.


ma, le, ub͕u a ka usu madu nābia, ndi-inyinya nēje abua abua. O we za, si, Ọ dawo, Babilon adawo; ọzọ, arusi nile apiri api nke chi-ya nile ka etipiaruworo ala.


Bel eruruwo ala, Nebo amakpuwo amakpu; arusi nile ha di n'elu anumanu na n'elu anu-ulo: ihe nile unu nēbughariri bu ibu eboro ebo, ha bu ibu eboro anu nāda #mbà.


Ha amakpuwo, ruru ala n'otù; ha apughi ime ka ibu wezuga onwe-ya, kama ha onwe-ha alawo na ndọta-agha.


Welie anya-gi abua le buruburu, we hu: ndia nile achikọtawo onwe-ha, biakute gi. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta,) n'ezie ha nile ka i gēyiri dika ihe-ichọ-nma, were ha ke, dika nwunye ọhu.


Teta, teta, yiri ike-gi dika uwe, gi Zaion; yiri uwe-gi nile mara nma, gi Jerusalem, bú obodo nsọ: n'ihi na onye nēbighi úgwù na onye ruru árú agaghi-abata kwa nime gi ọzọ site n'ub͕u a.


O we yiri ezi omume dika uwe-agha, kpu kwa okpu-agha nzọputa n'isi-Ya; O yiri kwa uwe nile nke ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ha buru uwe-oyiyi-Ya, O were ekworo kpuchie Onwe-ya dika uwe-nwuda.


Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.


Ndi ala ọzọ gēguzo nāzù ìgwè ewu na aturu-unu, umu ala ọzọ gābu kwa ndi-ọlu-ubi-unu na ndi-ọlu-ubi-vine-unu.


Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia.


Ihe-efu ka ha bu, ọlu ikwa-emò: na mb͕e nleta-ha ha gāla n'iyì.


Fero, bú eze Ijipt, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ya nile;


O gētipia kwa ogidi nile nke ulo anyanwu, nke di n'ala Ijipt; ọ bu kwa ulo nile nke chi nile nke Ijipt ka ọ gēsure n'ọku.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iji nmehie-ha leta Amon nke No, leta kwa Fero, leta kwa Ijipt, leta kwa chi-ya nile, leta kwa ndi-eze-ya; ọbuná Fero, na ndi nātukwasi ya obi:


N'ihi na ọ bu n'ihi na i tukwasiwo obi-gi n'ọlu-gi nile na n'àkù-gi nile ka agēwere kwa gi onwe-gi: Kemosh gāpu kwa so ndi gēje biri n'ala ọzọ, na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù.


M'gēsuye kwa ọku na mb͕idi Damaskọs, ọ gēripia kwa ulo nile di elu nke Ben-hedad.


Gosinu n'etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.


M'gēji kwa nmehie-ya leta Bel nime Babilon, M'gēme kwa ka ihe o loworo si n'ọnu-ya puta; mba di iche iche agaghi-erùkuru kwa ya ọzọ dika miri: ọzọ mb͕idi Babilon gāda.


Ọ dighi ukwu madu gāgabiga nime ya, ọ dighi kwa ukwu anumanu gāgabiga nime ya, agaghi-ebi kwa nime ya ọgu arọ abua.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye Nebukadreza, bú eze Babilon, ala Ijipt; ọ gāchilaga kwa ìgwè ndi-ya, kwata ihe-nkwata-ya, luta ihe-nluta-ya n'agha; o we buru ugwọ-ọlu agākwu usu-ndi-agha-ya.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka arusi nile la n'iyì, M'gēme kwa ihe-efu nile kwusi na Nof; ọ dighi kwa onye-isi gēsi n'ala Ijipt puta ọzọ: M'gētiye kwa egwu n'ala Ijipt.


ọzọ kwa, chi nile ha, ha na arusi nile ha akpuru akpu, tiyere ihe nile ha anāchọsi ike nke-uku nke ọla-ọcha na nke ọla-edo, ka ọ gādọta n'agha bata n'Ijipt; ma ya onwe-ya gēguzo arọ ufọdu ghara imegide eze Ugwu ahu.


Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.


Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.


ka unu yikwasi kwa madu ọhu unu, nke ekère dika Chineke chọrọ nime ezi omume na idi-ọcha nke ezi-okwu ahu.


Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.


Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi;


ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan