Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 43:11 - Bible Nso

11 Ọ gābia kwa, tib͕ue ala Ijipt; ndi diri ọnwu ka agēnye n'ọnwu, ndi diri ndọta-n'agha ka agēnye na ndọta-n'agha, ndi diri mma-agha ka agēnye na mma-agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ọ ga-abịa buso Ijipt agha, si otu a mee ka ha nwụọ, bụ ndị ahụ a kwadobere maka ọnwụ, mee ka a dọta ha nʼagha, bụ ndị ahụ a kwadobere na-aga adọta nʼagha; mekwaa ka ha nwụọ site na mma agha bụ ndị ahụ a kwadobere na ha ga-anwụ site na mma agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 43:11
15 Iomraidhean Croise  

Nka bu òkè madu nke nēmebi iwu site n'aka Chineke, Na ihe-nketa-ya nke Chineke siri ya keta.


O gēru kwa, mb͕e ha gāsi gi, Òle ebe ayi gāpu? i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ndi diri ọnwu gāpukuru ọnwu; ndi diri mma-agha gāpukuru mma-agha; ndi diri oké unwu gāpukuru oké unwu; ndi diri ndọta-n'agha gāpukuru ndọta-n'agha.


N'ihi na otú a ka Jehova, bu Chineke nke Israel, sirim: Nara iko manya nke ọnuma nka n'akam, me ka mba nile ṅua ya, bú ndi Mu onwem nēziga gi jekuru.


Fero, bú eze Ijipt, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ya nile;


Ma ub͕u a maranu nke-ọma na ọ bu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, ka unu gānwu n'ebe ahu nke ọ nātọ unu utọ ije nọ dika ọbìa n'ebe ahu.


M'gēwere kwa ndi Juda fọduru, bú ndi doworo iru-ha ibà n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, agēme kwa ka ha nile gwusia; n'ala Ijipt ka ha gāda; site na mma-agha na site n'oké unwu ka agēme ka ha gwusia: ha gānwu, site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, site na mma-agha na site n'oké unwu: ha gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta.


M'gēji kwa nmehie nke ndi bi n'ala Ijipt leta ha, dika M'jiworo nmehie nke Jerusalem leta ya, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe:


Ọ dighi ukwu madu gāgabiga nime ya, ọ dighi kwa ukwu anumanu gāgabiga nime ya, agaghi-ebi kwa nime ya ọgu arọ abua.


Otù uzọ n'uzọ atọ nime gi gānwu site n'ajọ ọria nēfe efe, ọ bu kwa site n'oké unwu ka ha gāgwusi n'etiti gi; otù uzọ n'uzọ atọ gāda site na mma-agha buruburu gi; ọzọ, otù uzọ n'uzọ atọ ka M'gāb͕asa nye ifufe nile, M'gāmiputa kwa mma-agha n'azu ha.


M'we si, M'gaghi-azù unu: nke nānwu anwu, ya nwua; nke anēbipu ebipu, ka ebipu ya; ka ndi fọduru rie, aturu ọ bula anu-aru ibe-ya.


Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan