Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 43:10 - Bible Nso

10 si ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iziga kuru Nebukadreza, eze Babilon, bú orùm, dọkwasi oche-eze-ya n'elu nkume ndia nke m'zobeworo; ọ gēseti kwa ulo-ǹdò-ya n'elu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mgbe ahụ sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel sịrị, Aga m ezi ozi kpọta ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn. Aga m edokwasịkwa ocheeze ya nʼelu nkume ndị a m zoro nʼebe a, ọ ga-agbasa ụlọ ndo nke ịbụ eze ya nʼelu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 43:10
19 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Ben-hedad nuru okwu a, mb͕e ọ nāṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi-eze, n'ulo-ntu, na ọ siri ndi-orù-ya, Donu onwe-unu n'usoro. Ha we do onwe-ha n'usoro imegide obodo ahu.


Ha we pua n'etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka.


Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu; Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.


N'ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n'ulo-ntu-Ya n'ubọchi ihe ọjọ: Ọ gēzobem n'ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya; N'oké nkume ka Ọ gēbulim elu.


I nēzobe ha n'ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n'aka nkekọta nile nke madu: I nēdebe ha na nzuzo n'ulo-ntu ka ha pua n'ise-okwu nke ire di iche iche.


Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Sairọs, si, Ọ bu onye-ọzùzù-aturum, ihe nile nke nātọm utọ ka ọ gēmezu kwa: ọbuná n'ikwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēwu ya; na n'isi ulo uku Chineke, Agātọ ntọ-ala-gi.


Otú a ka Jehova siri onye-Ya etere manu, bú Sairọs, onye M'jideworo aka-nri-ya, izọda mba di iche iche n'iru ya, ọ bu kwa úkwù ndi-eze ka M'gēkepu; imeghe uzọ n'iru ya, agaghi-emechibido kwa ọnu-uzọ-ama;


N'ihi na, le, M'gaje ikpọ ab͕uru nile nke ala-eze nile nke Ugwu òkù, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ha gābia kwa, do, onye ọ bula oche-eze-ya, n'oghere ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem, na imegide mb͕idi-ya nile buruburu, na imegide obodo nile nke Juda.


Were nkume di uku n'aka-gi, zobe ha n'urọ n'ebe ahu anākpu brick nke di n'ọnu-uzọ ulo Fero na Tahpanhes, n'anya ndi Juda;


Okwu ahu nke Jehova gwara Jeremaia, bú onye-amuma, bayere ọbibia nke Nebukadreza, bú eze Babilon, itib͕u ala Ijipt.


M'gēdo kwa oche-eze nkem n'Ilam, M'gēme kwa ka eze na ndi-isi si n'ebe ahu la n'iyì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Otù uzọ n'uzọ atọ nime gi gānwu site n'ajọ ọria nēfe efe, ọ bu kwa site n'oké unwu ka ha gāgwusi n'etiti gi; otù uzọ n'uzọ atọ gāda site na mma-agha buruburu gi; ọzọ, otù uzọ n'uzọ atọ ka M'gāb͕asa nye ifufe nile, M'gāmiputa kwa mma-agha n'azu ha.


ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma:


Ma eze ahu were iwe; o we ziga usu-ndi-agha-ya nile, la ndi-ob͕u-madu ahu n'iyì, rechapu kwa obodo-ha ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan