Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 42:5 - Bible Nso

5 Ndi ahu we si Jeremaia, Ka Jehova buru onye-àmà nēkwu ezi-okwu nke kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi n'etiti ayi, ọ buru na ọ bughi dika okwu ahu nile si di, nke Jehova, bú Chineke-gi, gēzite gi ka i were ya biakute ayi, otú a ka ayi gēme.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ha sịrị Jeremaya, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 42:5
17 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na i weda umum ndinyom n'ala, ọ buru kwa na i kuru ndinyom tiyere umum ndinyom, ọ dighi onye ayi na ya nọ; le Chineke bu onye-àmà n'etiti mu na gi.


Ha si Moses, Gi onwe-gi kpayere ayi uka, ayi gānu kwa: ma Chineke akpayerela ayi uka, ka ayi we ghara inwu.


Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.


N'ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n'ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya:


Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu:


Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na ndi Israel nile, we ghara ige nti olu Jehova, ibi n'ala Juda.


Ma ọ buru na ha asi, Jehova nādi ndu; n'ezie n'okwu-ugha ka ha na-aṅu iyi.


Nurunu, unu ndi nile di iche iche, unu nile; ṅa nti, gi uwa, na ùjú-ya: ka Onye-nwe-ayi Jehova ghọ onye-àmà n'etiti unu, bú Onye-nwe-ayi site n'ulo uku Ya di nsọ.


Ma unu asiwo, N'ìhi gini? N'ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n'etiti gi na nwunye i lutara n'okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


N'ihi na Chineke, Onye m'nēkpere nime mọm n'ozi ọma nke Ọkpara-Ya, bu Onye-àmàm, otú m'nārapughi aka n'ihota unu,


nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;


Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si, Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère:


Ndi - okenye Gilead we si Jefta, Jehova bu onye nānu okwu a n'etiti ayi, ma ọ buru na ayi emeghi otú a, dika okwu-gi nile si di.


Ọ si ha, Onye-àmà ka Jehova bu imegide unu, onye-àmà ka onye nke Ya etere manu bu kwa ta, na unu achọtaghi ihe ọ bula n'akam. Ha we si, Onye-àmà ka Ọ bu.


Jonatan we si Devid, La n'udo, n'ihi na ayi aṅuwo iyi, ayi abua, n'aha Jehova, si, Jehova gānọ n'etiti mu na gi, na n'etiti nkpurum na nkpuru-gi, rue mb͕e ebighi-ebi. O we bilie, la: Jonatan we ba n'obodo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan