Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 42:3 - Bible Nso

3 ka Jehova, bú Chineke-gi, we gosi ayi uzọ ahu nke ayi gēje ije nime ya, na ihe ayi gēme.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Kpee ekpere ka Onyenwe anyị Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 42:3
13 Iomraidhean Croise  

Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, n'ihi na I nēzí ha ezi uzọ nke ha ganēje ije nime ya; Gi me kwa ka miri zokwasi ala-Gi, nke I nyeworo ndi-Gi ibu ihe-nketa.


M'we kpọsa obubu-ọnu n'ebe ahu, n'akuku osimiri Ahava, iweda onwe-ayi n'ala n'iru Chineke-ayi ichọta n'aka-Ya uzọ ziri ezi nye onwe-ayi, nye kwa umu-ntakiri-ayi, nye kwa àkù-ayi nile.


Jehova, zím uzọ-Gi; Durukwam n'okporo-uzọ di lari, N'ihi ndi nēchem anwu.


Zim uzọ-Gi Jehova; m'gējeghari n'ezi-okwu-Gi: Me ka obim di n'otù itu egwu aha-Gi.


N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.


Ọtutu ndi di iche iche gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, rue ulo Chineke nke Jekob; O gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n'okporo-uzọ-Ya nile: n'ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta.


Otú a ka Jehova siri, Guzonu n'uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.


Ọtutu mba gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, ru kwa ulo Chineke nke Jekob; Ọ gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n'okporo-uzọ-Ya nile: n'ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta.


N'ihi na ònye di n'etiti anu-aru nile, nke nuworo olu Chineke di ndu ka O nēkwu okwu site n'etiti ọku, dika ayi nuru, ọ di kwa ndu?


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nkpuru-obi-ha di ha otú a, itu egwum, na idebe ihe nile M'nyere n'iwu ubọchi nile, ka ọ we diri ha nma, di-kwa-ra umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi!


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan