Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 42:20 - Bible Nso

20 N'ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n'ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta Onyenwe anyị Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 42:20
17 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti: Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum.


Okwu nile nke ajọ omume nile dikaririm ike: Njehie nile ayi, Gi onwe-gi gēkpuchi ha.


Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di.


Ma ọbuná n'ihe a nile nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u, bú Juda, ejighi obi-ya nile laghachikutem, kama o ji okwu-ugha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Zedekaia, bú eze, we zìe Jehukal nwa Shelemaia, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, jekuru Jereamia, bú onye-amuma, si, Biko, kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere.


Eze, bú Zedekaia, we ziga, kutara onwe-ya Jeremaia, bú onye-amuma, rue nbata nke-atọ nke di n'ulo Jehova: eze we si Jeremaia, Mu onwem gaje iju gi otù ihe; ezonarilam ihe ọ bula.


si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n'iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n'ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n'ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi:


Ndi ahu we si Jeremaia, Ka Jehova buru onye-àmà nēkwu ezi-okwu nke kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi n'etiti ayi, ọ buru na ọ bughi dika okwu ahu nile si di, nke Jehova, bú Chineke-gi, gēzite gi ka i were ya biakute ayi, otú a ka ayi gēme.


Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu:


Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.


bú ihe-igu-ọku nke ndi-nmehie ndia ndi megidere nkpuru-obi-ha, ka ewere kwa ha kpu mbadamba ihe ibu ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà: n'ihi na ha wetara ha nso n'iru Jehova, ha di kwa nsọ: ha gābu-kwa-ra umu Isael ihe-iriba-ama.


Ma aha Eron ka i gēdekwasi na nkpa-n:aka Livai: n'ihi na ọ bu otù nkpa-n'aka ka onye-isi ọ bula nke ulo nke ndi bu nna-ha gēnwe.


Otù onye n'etiti ha, bú onye-iwu, we jua Ya ajuju, nānwa Ya,


Una ekwela ka eduhie unu; Chineke abughi onye anēlelì: n'ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n'ubi.


Ma ghọnu ndi nēme okwu ahu, unu abu-kwa-la ndi nānu nání, ndi nārafu onwe-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan