Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 40:7 - Bible Nso

7 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta n'ala-ha, na o me-kwa-ra ya onye-nlekọta nke ndikom na ndinyom na umu-ntakiri, bú ufọdu nime ndi nēnweghi ike n'ala, nime ndi anēmeghi ka ha je biri na Babilon;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 40:7
14 Iomraidhean Croise  

Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka onye-isi ndi-ob͕ū mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlụ-ubi.


Ewe tipue obodo, ndikom agha nile we b͕apu n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige: (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) eze we je n'uzọ Araba.


Ma Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ufọdu nime ndi Israel ndi nēnweghi ike, bú ndi nēnweghi ihe ọ bula, fọdu n'ala Juda, o we nye ha ubi-vine na ubi n'ubọchi ahu.


ha we ziga, weputa Jeremaia n'ogige ulo-nche, nye ya n'aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka o we me ka ọ pua la: o we biri n'etiti ndi Israel.


O rue, mb͕e Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-agha nile huru ha, na ha b͕alagara, were abali si n'obodo ahu pua, n'uzọ ubi eze ab͕ara ogige, n'ọnu-uzọ-ama nke di n'etiti mb͕idi abua: o we pua ga n'uzọ Araba.


Ma ndi Israel nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo ahu, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru ya, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n'ebe ahu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri na Babilon.


O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, onye bu kwa otù nime ndi-isi nke eze, ya na-ndikom iri, biakutere Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa; ha we rikọ nri n'ebe ahu na Mizpa.


Ishmael we dọta ndi Israel nile fọduru ndi nọ na Mizpa n'agha, bú umu-ndinyom eze, na ndi Israel nile fọduru na Mizpa, ndi Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta-ha: Ishmael nwa Netanaia we dọta ha n'agha, je igabigakuru umu Amon.


Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we nu ihe ọjọ ahu nile nke Ishmael nwa Netanaia mere,


bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na umu-ndinyom eze, na madu ọ bula nke Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ọ nọdu n'aka Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, na Jeremaia, bú onye-amuma, na Beruk nwa Neraia;


Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka Nebuzaradan, onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlu-ubi.


Ndi nile nke ala nka gādi n'àjà-nbuli a diri onye-isi n'Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan