Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 4:9 - Bible Nso

9 O gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na obi eze gāla n'iyì, ya na obi ndi-isi; ibobo gānwu kwa ndi-nchu-aja n'aru, ọ gāb͕agwoju kwa ndi-amuma anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba; ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja, otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 4:9
20 Iomraidhean Croise  

Ewe tipue obodo, ndikom agha nile we b͕apu n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige: (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) eze we je n'uzọ Araba.


Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua; N'ihi na echezọwom iri nrim.


N'ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n'ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n'elu ya.


Ewe wusi mọ Ijipt n'etiti ya; ndum-ọdu-ya ka M'gēloda kwa: ha gāju kwa ihe-efu nile ha ase, ju kwa ndi-ntamu-ha, ju kwa ndi nāju mọ ihe, ju kwa ndi-dibia-afa.


Mb͕e ọ bula ọ nāgabiga ọ gējide unu; n'ihi na kwa-ututu ka ọ gāgabiga, n'ehihie na n'abali: o we buru nání ọma-jijiji ighọta ihe anuru.


Dika ihere onye-ori mb͕e anāchọputa ya, otú a ka emeworo ka ihere me ulo Israel; ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-aja-ha, na ndi-amuma-ha;


Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu: n'ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M'gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike.


Òle ebe kwa ka ndi-amuma-unu nọ, bú ndi buru unu amuma, si, Eze Babilon agaghi-abia imegide unu, ma-ọbu imegide ala nka?


Ewerewo Keriot, anarawo kwa ebe nile ewusiri ike, obi ndi-dike Moab n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.


ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?


Ewe tipue obodo, ndi-agha nile we b͕apu, pua n'obodo n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige; (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) ha we je n'uzọ Araba.


Lenu, ndi-nlelì-anya, ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu; N'ihi na ọlu ka Mu Onwem nālu n'ubọchi-unu, Ọlu unu nāgaghi-ekwe ma-ọli ọ buru na onye ọ bula kọrọ unu akukọ-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan