Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 4:29 - Bible Nso

29 Site n'olu ndi-inyinya na ndi-ọb͕a-uta obodo a nile nāb͕alaga; ha abawo n'ọhia b͕ara ọchichiri, ọ bu kwa na nkume nile di elu ka ha rigoworo: obodo ọ bula ka arapuworo, ọ dighi kwa onye ọ bula nēbi nime ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso. Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa; ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu. Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 4:29
14 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka ndi-isi usu-ndi-agha nke eze Asiria nwere biakwasi ha, ha we jide Manase n'ọhia-ogwu, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, me ka o jerue Babilon.


Nnù abua na ọgu iri gēsi n'iru iba-nba nke otù onye b͕alaga; n'iru iba-nba nke madu ise ka unu gēsi b͕alaga: rue mb͕e unu gāfọdu dika otù osisi-ọkọlọtọ n'elu ugwu, na dika ọkọlọtọ n'elu ugwu ntà.


rue mb͕e Jehova meworo ka madu je n'ebe di anya, o we rie nne, bú ebe arapuru arapu n'etiti ala ahu.


Le, M'gaje iziga kpọ ọtutu ndi-ọ́kù, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gākùru ha; emesia M'gēziga kpọ ọtutu ndi-ntá, gēsi n'elu ugwu ọ bula, na n'elu ugwu ntà ọ bula, na nime nb͕awa nkume nile di elu, chu ntá ha.


Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Ewe tipue obodo, ndi-agha nile we b͕apu, pua n'obodo n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige; (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) ha we je n'uzọ Araba.


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion.


Ahurum Onye-nwe-ayi, ka Ọ nēguzo Onwe-ya n'akuku ebe-ichu-àjà-Ya: O we si, Tie isi-ogidi nile, ka nbata-uzọ nile we me nkpatu: tijisie ha n'isi ha nile; ma ndi-ikpe-azu nime ha ka M'gēji mma-agha b͕ue: onye-ha nke nāb͕alaga ab͕alaga agaghi-ab͕alaga; ọzọ, onye-ha nke nāb͕apu ab͕apu agaghi-ewepuga onwe-ya.


Mb͕e ahu ka ha gāmalite isi ugwu, Dakwasinu ayi; na isi ugwu ntà, Kpuchienu ayi.


Ndikom Israel we hu na nkpà nākpà ha, (n'ihi na anāchi Israel n'ihe-ike), ndi Israel we zo onwe-ha n'ọb͕à, na n'ọhia-ogwu, na nime nkume di elu, na n'ulo-elu, na n'olùlù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan