Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 4:16 - Bible Nso

16 hotaranu mba nile; le, menu ka anuru ya megide Jerusalem, si, na ndi-nche nābia site n'ala di anya, ha we me ka olu-ha da megide obodo nile nke Juda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere Jerusalem: ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 4:16
18 Iomraidhean Croise  

Bianu nso, unu mba, inu ihe; unu ndi di iche iche kwa, ṅanu nti: ka uwa nu, ya na ùjú-ya; elu-uwa dum madu bi, na ihe nile si nime ya aputa.


Aisaia, bú onye-amuma, we biakute eze, bú Hezekaia, si ya, Gini ka ndikom ndia siri gi? òle ebe ka ha si kwa biakute gi? Hezekaia we si, Ọ bu n'ala di anya ka ha si biakutem, ọbuná na Babilon.


N'ihi na, le, M'gaje ikpọ ab͕uru nile nke ala-eze nile nke Ugwu òkù, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ha gābia kwa, do, onye ọ bula oche-eze-ya, n'oghere ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem, na imegide mb͕idi-ya nile buruburu, na imegide obodo nile nke Juda.


Ha gānwu kwa, ma ndi uku ma ndi ntà, n'ala nka: agaghi-elì ha, madu agaghi-eti-kwa-ra ha aka n'obi, madu agaghi-ebì kwa onwe-ya mma, ọ gaghi-eme-kwa-ra ha isi-nkwọcha:


Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n'efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi.


Nurunu okwu Jehova, unu mba nile, gosi-kwa-nu ya n'agwe-etiti nile di n'ebe di anya; si-kwa-nu, Onye nēfesa Israel gāchikọta ya, debe kwa ya, dika onye-ọzùzù-aturu si emere ìgwè aturu-ya.


(n'arọ nke-iteghete nke Zedekaia, bú eze Juda, n'ọnwa nke-iri, ka Nebukadreza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, biaruru Jerusalem, we nọchigide ya n'agha;


Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n'ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n'okpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Le, anameme ka otù mba si n'ebe di anya biakwasi unu, ulo Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta:) mba di ike ka ọ bu, mba nke sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka ọ bu, ọ bu mba nke i nādighi-ama asusu-ya, nke I nādighi-anu kwa ihe ha nēkwu.


N'ihi ya ọdum nke sitere n'oké ọhia gētib͕u ha, anu-ọhia wolf nke ala ihe nādighi gēbibi ha, agu ganēche obodo nile ha anya, agādọb͕u onye ọ bula nke nāpu nime ha: n'ihi na njehie-ha di ọtutu, ndaghachi-azu nile nke ha di kwa ike.


Gosinu n'etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.


N'ihi nka nurunu, unu mba nile, mara kwa, unu nzukọ, ihe di n'etiti ha.


Nuru, gi uwa: le, Mu onwem nēme ka ihe ọjọ biakwasi ndi nka, bú nkpuru nke èchìchè nile ha, n'ihi na okwum nile ka ha nāṅaghi nti; iwum kwa, ha ajuwo ya.


Otú a ka Jehova siri, Le, otù ndi nēsi n'ala Ugwu bia: mba uku ka agākpọte kwa site na nsọtu nile nke uwa.


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion.


Le, ọ bu olu ntiku nke ada ndim site n'ala di anya nke-uku: Jehova, Ọ̀ nọghi na Zaion? Eze-ya, Ọ̀ nọghi nime ya? Gini mere ha ji were arusi nile ha apiri api, were kwa ihe-efu nile nke onye ala ọzọ, kpasuem iwe?


N'aka-nri-ya ka ihe iji ju ase bayere Jerusalem di, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi, isaghe ọnu n'ob͕ub͕u, iweli olu n'iti nkpu agha, ido ihe di iche iche eji etipú mb͕idi imegide ọnu-uzọ-ama nile, iwukọta obo-ihe, iwu ulo-agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan