Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 38:2 - Bible Nso

2 Otú a ka Jehova siri, Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpukuru ndi Kaldea gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata, o we di ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Onye ọbụla nọgidere nʼime obodo a ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ, maọbụ site nʼọrịa na-efe efe. Ma onye ọbụla pụkwuru ndị Babilọn ga-adị ndụ. Ọ ga-adị ndụ, nʼihi na ọ ga-echebe ndụ ya.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 38:2
20 Iomraidhean Croise  

Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'ganēchighari ihe agha nile nke di n'aka-unu, nke unu onwe-unu ji ebuso eze Babilon na ndi Kaldea agha, bú ndi nānọchigide unu n'agha n'azu mb͕idi obodo, M'gāchikọta kwa ha n'etiti obodo a.


Ma dika fig ọjọ ndia, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha; n'ezie otú a ka Jehova siri, Otú a ka M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya, na ndi Jerusalem fọduru, bú ndi fọduru n'ala nka, na ndi bi n'ala Ijipt, nye:


Ma mba ahu nke gēme ka olu-ya ba na yoke nke eze Babilon, nke gēfe kwa ya, M'gēkwe kwa ka mba ahu nọdu n'elu ala-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ha gālu kwa ya, biri kwa nime ya.


N'ìhi gini ka unu gānwu, gi onwe-gi na ndi-gi, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, dika Jehova kwuworo bayere mba ahu nke nāgaghi-efe eze Babilon?


N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere eze ahu nke nānọkwasi n'oche-eze Devid, baye-kwa-ra ndi nka nile nke bi n'obodo a, bú umu-nne-unu ndi nēsoghi unu pua ije n'ala ọzọ ebe emere ka unu je biri;


M'gēji kwa mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ọria nēfe efe, chuso ha, M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, ibu ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, na ibu ihe-ita-uta, n'etiti mba nile ebe M'chugaworo ha:


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M'nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n'ajọ ọria nēfe efe, na ibà n'oké unwu; M'gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.


N'ihi na aghaghm ime ka i wepuga onwe-gi, ọ bughi kwa na mma-agha ka i gāda, kama ndu-gi gāghọrọ gi ihe-nkwata: n'ihi na i b͕abàwo nimem: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọ bu kwa otú a ka ndikom ahu nile gādi, bú ndi doworo iru-ha ibà n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu; ha gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ha agaghi-enwe kwa ndi fọduru ma-ọbu ndi b͕apuru ab͕apu n'iru ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ha.


Ma ub͕u a maranu nke-ọma na ọ bu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, ka unu gānwu n'ebe ahu nke ọ nātọ unu utọ ije nọ dika ọbìa n'ebe ahu.


M'gēji kwa nmehie nke ndi bi n'ala Ijipt leta ha, dika M'jiworo nmehie nke Jerusalem leta ya, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe:


Ma gi onwe-gi, ì nāchọrọ onwe-gi ihe uku? achọla ha: n'ihi na, le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi anu-aru nile, bú madu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma M'gēnye gi ndu-gi ka ọ buru ihe-nkwata n'ebe nile i gēje.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Àgēsi kwa aṅa naputa ya ma-ọli mb͕e ọ bu ikpém anọ jọrọ njọ, bú mma-agha na oké unwu na ajọ anu-ọhia na ajọ ọria nēfe efe, ka M'zigara na Jerusalem, ibipu madu na anumanu nime ya?


Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Kua ọbu-aka-gi, zọ kwa ukwu-gi n'ala, si, Éwù! n'ihi ihe-árú ọjọ nile nke ulo Israel: n'ihi na ha gēsite na mma-agha, site kwa n'oké unwu, site kwa n'ajọ ọria nke nēfe efe, da.


Mma-agha di n'èzí, ajọ ọria nke nēfe efe na oké unwu di kwa n'ulo: onye nọ n'ọhia gānwu na mma-agha; ọzọ, onye nọ n'obodo, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gērichapu ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan