Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 38:19 - Bible Nso

19 Eze, bú Zedekaia, we si Jeremaia, Mu onwem nātu egwu ndi-Ju ndi dakuruworo ndi Kaldea, na ha gēnyem n'aka-ha, ha ewe kwam emò.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Eze Zedekaya sịrị Jeremaya, “Mụ onwe m na-atụ egwu ndị Juu ahụ bụ ndị gbakwuru ndị Babilọn, nʼihi na ndị Babilọn nwere ike nyefee m nʼaka ha, ha ga-emesikwa m ike.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 38:19
17 Iomraidhean Croise  

Ndi-ọb͕a-ọsọ ahu we nāgabiga site n'obodo rue obodo n'ala Efraim na Manase, we rue Zebulun: ha we nāchì ha ọchì, lelì kwa ha anya.


O rue, mb͕e Sanbalat nuru na ayi onwe-ayi nālu mb͕idi, na iwe-ya di ọku, ewe kpasue ya iwe, o we chìa ndi-Ju ọchì.


N'ihi na anamama jijiji ìgwè madu bara uba, Na n'ihi na nleda-anya nke ab͕uru nile nēmem ka m'tua ujọ, M'we nọ dū, ghara isi n'ọnu-uzọ pua-


Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.


Ma ònye ka i cheb͕uworo onwe-gi bayere ya, we tua egwu ya, na i nēkwu okwu-ugha, we ghara ichetam, ghara kwa itiye ya n'obi-gi? Mù onwem adighi-ab͕a nkiti ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, i we ghara itu egwum?


I ràwom urà, Jehova, ewe ràram: I jidewom, we nwe ike karim: aghọwom ihe-ichì-ọchì ogologo ubọchi nile, madu nile ọ bula nākwam emò.


Le, ndinyom ahu nile ndi fọduru n'ulo eze Juda gābu ndi emeworo ka ha pukuru ndi-isi eze Babilon, ndinyom ahu ganāsi kwa, Ndi gi na ha di n'udo akpaliwo gi, we nwe ike n'aru gi: ukwu-gi abua emiwo n'apiti, ha we laghachi azu.


Eze, bú Zedekaia, we si, Le, onye ahu di n'aka-unu: n'ihi na eze abughi onye puru ime ihe ọ bula megide unu.


Ma ndi Israel nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo ahu, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru ya, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n'ebe ahu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri na Babilon.


Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ:


O rue, mb͕e obi-ha di nma, na ha siri, Kpọnu Samson, ka ọ we mere ayi ihe-ọchì. Ha we si n'ulo ndi ekere ab͕u kpọputa Samson; o we me ihe-ọchì n'iru ha: ha we me ka o guzo n'etiti ogidi.


O we me ngwa kpọ nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, si ya, Miputa mma-agha-gi, me ka m'nwua, ka ha we ghara ikwu okwu bayerem, si, Nwayi b͕uru ya. Nwa-okorọbia-ya we mapue ya, ọ nwua.


Sọl we si Samuel, Emehiewom: n'ihi na agabigawom okwu-ọnu Jehova na okwu-gi nile: n'ihi na aturum egwu ndi Israel, we ge nti olu-ha.


Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa mma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia mapuem aru, we kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan